Cashless policy: Ị dọrọ maọbụ wepụ ego n'ọba ego, ị kwụọ ụgwọ

ATM Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ka mgbe ATM batara na Naijiria, ọdịzịrị ụmụ mmadụ fecha fecha ị dọrọ ego n'ụlọakụ

Nke ụmụ Naịjirịa tetekwuru n'ụra nụ bụ na ha ga na-akwụ ụgwọ ma ha tinye maọbụ dọrọ ego n'ụlọakụ.

Nke a bụ iwu ụlọakụ kachasị na Naịjirịa bụ 'Central Bank of Nigeria'(CBN) tiri ọhụrụ a .

CBN kwuru na ha ga-amalite ime atụmaatu ejighị ego na-agagharị n'ọnwa Maachi nke afọ 2020 na-abịanụ.

Ha kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha degara ụlọakụ niile dị na Naịjirịa.

Image copyright CBN Websit

N'ime akwụkwọ ahụ, ya bụ ụgwọ ga-amalite n'ụbọchị Seputemba iri na asatọ.

Onye chọrọ ịdọrọ ego karịrị puku narị ise ga-akwụ ụlọakụ ya pasenti atọ ebe onye chọrọ itinye ego ole ahụ n'ụlọakụ ga-akwụ paseenti atọ. Nke a bụ gbasara akpa ego nke onye.

A bịa n' akpa ego nke ụlọọrụ(Corporate account), onye dọrọ ego karịrị naira nde atọ ga-akwụ pasenti ise, nakwa onye chọrọ itinye ego karịrị naira nde atọ

Mana ihe ka na-agbagọjụ ndị mmadụ bụ na ọ bụ na naanị steeti ndị a ka a ga-amalite ya bụ atụmaatụ a.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka atụmaatụ a n'elu soshal midia

@Ayourb kwuru na atụmaatụ a jọgburu onwe ya.

@nafeezi kwuru na ndị mmadụ kwado maka mbuli ego mmanụ ụgbọala.

Nwaokorobia a na-ekwu ka ndị gbo ga-esi lafere ije a.

Mana @agbedere kwuru na atụmaatụ a abụghị ihe ọhụrụ.

Steeti ndị ahụ bụ:

  • Anambra
  • Lagos
  • Kano
  • Ogun
  • Rivers state
  • Abia

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPersonal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara