Port Harcourt Serial killings: Ụmụnwaanyị apụtala n'igwe na-eme ngagharịwe

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ndị uweojii chọpụtarala maka ụmụnwaanyị a tọgburu na Pọthakọt

Ndị uweojii nọ na PortHarcourt ekwuola na ha anwụchiela onye akọ n'ime ndị a na-eche na aka ha dị n'oke ogbugbu na-eme n'obodo ahụ.

Onyeisi ndị uweojii bụ Mustapha Dandaura kwuru na ha nwụchiri nwoke ahụ n'ụzụ ụtụtụ Wenesde mgbe otu ụlọ oriri na nkwarị kpọkuru ha gbata ọsọ enyemaka.

Dandaura kwuru na ụlọọriri na nkwarị kọrọ ha etu nwagbọghọ si tiwe mkpu n'ụlọ ndịna ha nke mere ka ha kpọwa ndị uweojii.

Ndị uweojii ruru ebe ahụ gbawa ụzọ ma hụ nwagbọghọ ahụ na okorobia. Nke nwaanyị kwuru na ka ha na-arahụ ụra n'abali nke nwoke weter akwa eji ehicha ahụ wee chọọ ịtọgbu ya nke mere ka o tiwe mkpu.

Egwu iwe ka ọtụtụ ụmụnwaanyị bi na Port Harcourt ji wee kele ụwa taa maka oke ogbugbu na-eme n'ụlọ nkwarị na oriri dị n'obodo ahụ.

Ụmụnwaanyị a na-agagharị ime mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii, Department of State Services Government(DSS), nakwa ụlọomeiwu ka ha gwa ha ha teta n'ụra na agwọ nọ n'akịrịka kwesiri ka echekwa ndị mmadụ ọfụma.

Ha chọkwara ka ha kwụsị ịkpọ ụmụnwaanyị nwụrụlanụ akwụna.

Ngaghariwe a na-abịa dịka ndị uweojii nwụchirịla mmadụ abụọ a na-eche na aka ha dị na ya bụ oke ogbugbu.

Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mustapha Dandaura gwara ndị ntaakụkọ na ụmụnwaanyị asatọ ka tọgbugoro n'ụlọ oriri na nkwarị dị iche iche na PortHarcourt.

Dandaura kwuru na ha nwuchiri otu onye n'ime ndị a na-eche so akpa mkpa mkpa a ụbọchị Monde mgbe otu nwaagbọghọ gwara ha na mmadụ kpọrọ ya n'ekwenti ma kwe ya nkwa ego ruru puku iri atọ ka o dịna ya.

Nke a mere ka ndị uweojii chọwa ya ma nwuchie ya. Ha nwuchiri onye nke abụọ ha nwetere na Kaduna steeti ma kwuo na ha ga-akpọghachi ya PortHarcourt ,ma che ha n'ihu ọha.

Gee ihe Kọmịshọna ndị uweojii Rivas steeti kwuru maka ya n'uju n'elu:

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara