Pneumonia Disease: Gịnị ka ị ma gbasara ọrịa a?

Onye ọrụ ahụike na-agba nwatakịrị ọgwụ mgbochi ọrịa 'Pneumonia'. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye ọrụ ahụike na-agba nwatakịrị ọgwụ mgbochi ọrịa 'Pneumonia'.

Kwa afọ, ihe karịrị ụmụaka dị otu nde na ụma isii (1.6 million) bụ ndị na-erubeghi afọ ise na-anwụ n'elu ụwaa n'ihi ọrịa ngụ Bekee kpọrọ 'Pneumonia'.

Dịka ndị otu mbaụwa na-ahụ maka ahụike bụ 'World Health Organization' si kwuo, otu nwata na-anwụ kwa nkeji iri abụọ ọbụla n'ihi ọrịa ọjọọ a.

Mana nke a apụtaghị na ọ bụ naanị ụmụntakịrị nwere ike ịrịa ọrịa ngụ, ọ na-emekwa ndị okenye.

A bịa n' Afrịka, Naịjiria bụ obodo ọrịa ngụ kacha emekpa ahụ.

Mana gịnị bụ 'Pneumonia'?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ngụgụ onye nwere ọrịa 'Pneumonia' dịka foto 'X-ray' si gosi.

Theresa Nwachukwu, dibia bekee bụ ọkachamara n'ihe gbasara ahụike ụmụaka, kwuru na 'Pneumonia' bụ ọrịa ngụgụ.

"Ọ bụrụ na nje 'bacteria' maọbụ 'fungi' maọbụ 'virus' baa mmadụ na ngụngụ, nke a ka a na-akpọ 'Pneumonia'".

Nwachukwu kọwara na ọrịa ngụ dị icheiche n'ihi na nje na-akpata ha abụghị otu.

N'ihi nke a, etu e si agwọ ya anaghị abụcha otu ihe.

Iji maa atụ, ọ bụghị ọgwụ e ji gwọọ ọịọrịa ngụ nke nje 'bacteria' kpatara ka e ji agwọ nke 'virus'kpatara.

Kedu ka e si ama onye nwere ọrịa a?

Nkenke aha onyonyo Dkt Mohammod Jobayer Chisti onye mba Bangaladesh na-azọpụta ụmụntakịrị nwere 'Pneumonia'.

Nwachukwu kwuru na ọrịa 'Pneumonia na-egosikarị onwe ya ma mmadụ na-enwe nhịahụ iku ume.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMgbatị ahụ na-achụ ọrịa ọsọ ụkwụ eru ala

Ọ na-emekwa mmadụ oke ụkwara nakwa obi ịcha ọkụ.

Nwachukwu kọwara sị: "Nwa ọhụrụ dị ihe dịka izu isii na-eku ume ọkụ, ọkụ karịa ugboro iri isii n'otu nkeji (60 breaths per minute), nwere ike ịbụ 'Pneumonia' na-enye ya nsogbu."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionE ji nka agwọ ọrịa obi ịdamba

"Ọ bụrụ nwa dị ọnwa atọ ruo ọnwa ise, okuku ume ya karịa ugboro iri ise n'otu nkeji (50 breaths per minute), o nwekwara ike ịbụ ọrịa ahụ."

"Maka nwa gbarala otu afọ, okuku ume ya karịa ugboro iri anọ n'otu nkeji (40 breaths per minute), marakwa na ala adịghị mma."

O kwukwara na ọ bụrụ na nwata na-eku ume imi ya na- emepe emepe, nke Bekee kpọrọ 'flaring of the nostrils', o nwere ike ịbụ 'Pneumonia'.

A bịa na ndị okenye, nke na-arịakarị ha bụ nke a kpọrọ 'Lobar Pneumonia'.

Oyi anaghị akpata 'Pneumonia'

Image copyright Twitter
Nkenke aha onyonyo N'ọnwa Febrụwarị afọ a, onyeisiala mba Brazịl bụ Jair Bolsonaro dara n'ọrịa 'Pneumonia'

Nwachukwu kọwara na ọ bụghị oke oyi na-akpata ọrịa ngụ.

Kama oyi nwere ike ịbọlite ya ma ọ bụrụ na mmadụ nweburu nje ahụ n'ime ahụ ya.

Ụzọ mgbochi ọrịa a

  • Hapụ iku nwatakịrị ma ọ bụrụ na ị na-akwa ụkwara maọbụ oyi na-ama gị. Nke a bụ ka ị ghara ibufe nwata ahụ nje.
  • E kwela ka nwata gaa nso n'ihe maọbụ ebe ọbụla nje nwere ike isi fee ya.
  • Gbaa nwatakịrị ọgwụ mgbochi ọrịa ngụ.

A na-agba ọgwụ mgbochi a ugboro anọ tupu nwata agbaa afọ abụọ.

1. Nke mbụ ma izu isii e jiri mụọ ya gachaa.

2. Nke abụọ bụ izu iri

3. Nke atọ bụ izu iri na anọ

4. Nke anọ bụ izu iri na ise.

Ọgwụgwọ Pneumonia

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye ọrụ ahụike na-etinyere nwatakịrị nwere ọrịa 'Pneumonia' ikuku

Ọ bụrụ nke nje 'bacteria' kpatara, a ga-enye onye ahụ ọgwụ Bekee kpọrọ 'Anti-Bacterial'.

Ọ bụrụ nke nje 'fungi' kpatara, onye ahụ ga aṅụkwa ọgwụ 'Anti-Fungal'.

Ọ bụrụ na iku ume na-ara onye ahụ ahụ nke ukwuu, e nwere ike itinyere ya ikuku nke Bekee kpọrọ 'Oxygen' ganye na o nweta onwe ya.

Mana ihe ndị a bụkwa n'ụlọọgwụ ka a ga-enye ya ma e mechaa nnyocha zuru oke.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCode Club: 'Etu anyị si eji 'coding' arụpụta ihe na-egbo mkpaeme'