Port Harcourt Killings: Ndị uweojii akpụpụtala onye ha ji maka ogbugbu ụmụnwaanyị

Uweojii Nigeria Image copyright Getty Images

Ndị uweojii na Rivas steeti akpọpụtala otu nwoke dịka onye ha na-ebo ebubo ogbugbu ụmụnwaanyị n'ụlọ ndina na steeti ahụ.

Akpụpụtala nwoke a n'ihu ndị ntaakụkọ n'ụtụtụ a.

Etu ogbugbu ụmụnwaanyị a dị iche iche siri yie ibe ya mere ọtụtụ mmadụ jiri na-asị na onwereike bụrụ atumatu Bekee kpọrọ "serial killing".

Etu ndị uweojii siri gbaa nwoke a n'anwụ mere ka ụfọdụ mmadụ na-ajụ na soshal midia ma amara ya ikpe tupu akpụpụ ya ụlọikpe.