National Live Stock Transformation Programme: Atụmatụ a abụghị Ruga - Ọnụ na-ekwuru Umahi

ọchị ehị Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo E gbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgụ dị n'etti ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ugbo

Ọtụtụ ndị Naịjirịa na-enwe mgbagwoju anya n'atụmatụ ịzụ anụmanụ nke gọọmentị etiti na-achọ ihiwe site n'aka osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo.

Atụmatụ a bụ nke a kpọrọ "National Live Stock Transformation Programme" (NLST) ka ndị Naịjirịa na-eche na ya na nke Ruga bụ otu ihe.

Cheta na gọomentị etiti wezụgara Ruga mgbe ka ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị ọwụwa anyanwụ, gbarụrụ ihu maka atụmatu ahụ.

Mana Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi, dịka onyeisioche kọmitii ndị isiochịchị bụ NEC n'ịcha hopụtara maka ịchị ehi, kọwara ndịiche ya na Ruga.

Site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Emma Uzo, Umahi kwuru hoohaa na atụmatụ "National Livestock Transformation Programme" abụghị Ruga.

Gịnị bụ 'National Live Stock Transformation Programme' a?

Image copyright Getty Images

Emma Uzo gwara BBC Igbo n'ekwentị na atụmatụ a bụ iji nyere ndị chọrọ ịzụ anụmanụ dịka ehi, ewu, atụrụ na ndị ọzọ aka.

Onye ọbụla, maọbụ steeti ọbụla chọrọ ịzụ anụmanụ nwereike ịgbaziri ego n'aka ụlọakụ etiti site n'atụmatụ a.

Ha ga-eji nwaayọ na-akwụghachị ụlọakụ etiti ụgwọ ma ọ bụrụ ha zụpụta anụmanụ ndị a ma ree ha.

Maazị Uzo gara n'ihu kwuo na ọ bụghị iwu na steeti ọbụla ga-eme ya kama na ọ bụ steeti ndị chọrọ ga-eme ya.

Cheta na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo gbapere mmalite atụmatụ a n'Adamawa Steeti n'ụbọchị 10 ọnwa Septemba, 2019.

Atụmatụ a a sị bụ iji wulite ọzụzụ anụmanụ na Naịjirịa ga-amalite na steeti asaa gụnyere Adamawa, Benue, Kaduna, Plateau, Nasarawa, Taraba na Zamfara.

Na nzukọ ndị NEC mere n'ụbọchị 19 Sepụtemba 2019, ha mpụtara ego dị otu narị ijeri naịra maka ya.

Gịnị bụ Ruga?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Atụmatụ Rural Grazing Area (RUGA) bụ nke onyeisiala Buhari wepụtara n'ọnwa Mee afọ 2019.

Maazị Uzo sịrị na ọ bụ iji kwụsị nsogbu dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi bụ nke tarala isi ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa.

Atụmatụ a bụ iwepụta oke ala na steeti ọbụla bụ ebe ndị na-achị ehi na ehi ha ga-ebi dịka a na-azụ ha.

O kwuru na a ga-ehiwe ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ. okporoụzọ, ụlọọgwụ ụmụanụmanụ, ụlọahịa na ihe ndị ọzọ ga-enye aka.

Ọtụtụ ndị mmadụ karịsịa ndị bi na mpaghara ọwụwụanyanwụ gbarụrụ ma katọọ ihu atụmatụ a.

Ha boro ebubo na ọ bụ ụzọ onyeisiala Buhari chọrọ iji kpọbatajuo ndị ọchị ehi na steeti dị iche iche.

N'ihi oke nkatọ a mere ka onyeisiala Buhari ji kwụsị atụmatụ RUGA n'ọnwa Julaị 2019.

Akụkọ ndị ga-amsị gị: