Anambra State Assembly : Oku anyị kpọrọ gọọmentii etiti abụghị ka ha bịa weghara Air Peace

Pascal Agbodike, Allen Onyema na ụgbọelu Airpeace Image copyright Agbodike/BBC
Nkenke aha onyonyo Pascal Agbodike, Allen Onyema na ụgbọelu Airpeace

Ndị omeiwu Anambara steeti ekwuola na ihe mere ha jiri kpọọ gọọmenti etiti oku ka ha mee ụlọọrụ ụgbọelu Air Peace ụgbọelu Naijiria bụ ka ụgbọelu ahụ nweta nkwado pụrụ iche n'aka gọọmentị.

Ndị ụlọomeiwu steeti ahụ nọrọ n'ọgbakọ ha kpebie ma kpọọ gọọmenti etiti oku ka ha were Air Peace mee ụgbọelu ala Naijiria iji kelee ụlọọrụ ụgbọelu ahụ maka ịkpọlata ụmụ Naijiria n'efu dịka nsogbu Xenophobia dagịdere ha na Saụt Afrịka.

Osote Onyeisi ụlọomeiwu Anambra steeti bụ Pascal Agbodike gwara BBC Igbo na oku ahụ o bulitere okwu ya n'ọgbakọ ha bụ iji mee ka Air Peace siwanye ike..

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ihe mere anyị ji chọọ ka gọọmenti mee Airpeace ụgbọelu Naijiria'

Pascal Agbodike gara n'ihu kọwaa na oku ahụ "abụghị ka gọọmentị etiti weghara Air Peace, na-eri uru na ọghọm,"

Kama ọ bụ "ka gọọmenti nye ha nkwado ego, na nkwado ime ka ihe na-agara ha siriri werere site na atụmatụ ha."

"Ka anyị hapụzie ịchọwa ụgbọelu nke anyị."

Cheta na Air Peace si Saụt Afrịka bulata ụmụ Naijiria karịrị nari ise na nsonso a.

Onye nwe ya bụ Allen Onyema, onye Mbosi n'Anambara steeti.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere m ji kpọlata ndị Naịjirịa nọ Saụt Afrịka

Akụkọ ga-amasị gị: