Allen Onyema: Onye ọbụla na-ebu ọgwụ ike na-egbu ndị mmadụ

Allen Onyema
Nkenke aha onyonyo Allen Onyema

Onyeisi ọdọ ụgbọelu Air Peace bụ Allen Onyema ekwuola na mmechi e mechiri ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu dabara adaba.

Onyema kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Satọde.

N'okwu ya Maazị Onyema sị: "Ọdọ ụgbọelu Enugwu bụ ọnya ọnwụ."

"Achọburu m ịkwụsị ụgbọelu m ifega Enugwu mana achọghị m ka ndị mmadụ ghọtahie m."

"Kamgbe afọ a injini ụgbọelu m emebiela ihe karịrị ugboro iri n'Enugwu."

"Ihe a na-ere otu injini ruru otu ijeri naịra."

"Mmechi e mechiri ọdọ ụgbọelu ahu bụ ihe kwesịrị ekwesị."

Mana Onyema rịọrọ gọọmentị etiti ka ha mee ngwa ngwa ịruzi ọdọ ụgbọelu ahụ.

Gbasara Xenophobia na Saụt Afrịka

Onyema kwuru na gọọmentị mba Saụt Afrịka na-akwado 'Xenophobia'.

O kwuru na ọtụtụ ndị nọ n'isi ọchịchị na mba Saut Afrịka so na-akwanye ndị be ha ọkụ n'ike ị na-emekpa ndị mbịarambịara ahụ.

Onyema kọwara otu o si hịara Air Peace ahụ isi Saụt Afrịka bulata ụmụ Naijiria.

O kwuru na ọbụ ihere mere ka ndị ọchịchị Saụt Afrịka ji mechaa nye ya ikike ibulata ụmụ Naịjiria.

N'okwu ya: "Otu n'ime ndị isi uweojii na Saụt Afrịka ji ọnụ ya kwuo na obodo ha abụghị maka ndị mbịarambịara."

"Onyeisiala Saut Afrịka (Cyril Ramaphosa) ji Xenophobia wee mee 'campaign'".

"Ndị uweojii na-anọ gbachi nkịtị mgbe a na-emebisi ihe ụmụ Naịjiria. O nweghi ihe ha na-eme."

Onyema kwuru na e nwere ọtụtụ ndị Naịjiria bụcha dibia bekee, ọkaiwu, ndị nkụzị na ndị ọzọ na-emecha ihe ọma dị icheiche na mba Saut Afrịka.

Mana ndị ọchịchị mba ahụ na-achọ igosi ka a ga-asị na ụmụ Naịjiria niile bụcha ndị ekperima.

Etu Onyema si malite

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere m ji kpọlata ndị Naịjirịa nọ Saụt Afrịka

Onyema kwuru na nne na nna ya bụ ndị Igbo mana a mụrụ ya na Bini.

Ọ gụrụ akwụkwọ n'obodo dị iche iche ma na ala Igbo ma na steeti ndị ọzọ.

O mechara gụọ na mahadum dị n'Ibadan ebe ọ nọrọ tozuo oke ịbụ onye ọkaiwu.

N'afọ 1990 ka ọ malitere ịrụ ọrụ na Legọs.

O mechara banye ire ala, werezie nwayọ nwayọ baa.

Onyema kwukwara na tupu ọ malite ụlọọrụ ụgbọelu Air Peace, ọ zụọla ọtụtụ ahịa.

"A na m atụbata igwe nju oyi, ma onyoonyoo televishon, dịrị gawazie."

Akụkọ ga-amasị ike: