Ipob: 'Oge anyị na ndị Gọvano ikpe udo agafeela'

Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra Image copyright Getty Images

Onye na-ahu maka mgbasa ozi ndị Ipob bụ Emmanuel Powerful ekwuola na ha na ndị Gọvanọ ọwụwaanyanwu agaghị enwe mkparita ụka ọbụla n'ihi na ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ na-agba ha mgba okpuru.

O kwukwara na oge ndi Govanọ nwere ohere ka ha nwee mkparịta ụka agaala.

Nkea na abia dịka gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi kwuru na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu adila njikere ha na Ipob inwe nzụkọ ka ụdo chia na izuụka abụọ gara aga.

Kama Emmanuel Powerful kwuru na ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwu bụ ogbatauhie megide ọchịchọ Biafra.

Mazi powerful kwuru na ihe kacha mkpa ugbua bụ ihu na ha nwetere 'Biafra'.

Ọ ga-kwara n'ihu kwuo na ndị Ipob dị njikere maka mmachi amachiri ha ma kwuo na ha ga-enwe ndidi n'ọchịchọ Biafra.

Emmanuel Powerful kwuru na ha na akwado maka njem onyeisi ha bụ Nnamdị Kalu ga-eme na Washongton DC nke dị n'Amerịka.

Powerful kwuru na njem a ga enyere aka inwete Biafra.

Agbaraka egbuola ehi n'Ondo

Image copyright Getty Images

Anyị nụrụ na egbeigwe agbagbuola ehi dị iri atọ na isii n'ọhịa arụsi dị n'okpuruọchịchị Ijare, Ifedore.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Femi Joseph kwetere na ọ bụ ọnwụ chị ha ka ha nwụrụ.

Eze obodo bụ Wemimo Olaniran sị na ọ teela aka adọwara ndị Fulani na-achị ehi aka na ntị maka ị ba na ya bụ ajọ ọhịa.

O kwukwara na ọnweghị onye ga-emetu ehi ndị ahụ aka ebe ahụ were ree.

Olaniran sị na ọ bụ nsọala ị ba na ya bụ ọhịa.

Ihe ndị sayensị nwere ikwu

Ndị Sayensi na-ekwu na ọ bụ amụma gburu ehi ndị a.

Onyenkuzi Fịziks na mahadum Naijirịa bụ Mbunwe Muncho Josephine na-akọwa na amụma nwere ụzọ o si aga ma kwuo na ihe ọbụla nọ na ya bụ ụzọ ga-ezute ike amụma.

Mbunwe kwuru na ọ bụrụ na ehi ndi a kwụọtọ na ha nwere ike idị ndụ mana ọ bụrụ na ha dinara adina, ha ga-anwụ.

Ọ sị na ọ ga-adị mma ka achọpụta ụzọ amụma a si aga were zere ya n'oge ụdụmmiri.

Nwoke agbagbuola nna ya n'ọhịa nta

Image copyright European Photopress Agency

Na mba Itali, otu nwoke agbagbuola nna ya na ọhịa nta.

Nke a abụghị mbụ ndị mmadụ na egburikọta onwe ha n'ọhịa nta na mba ahụ nke bụ na Minista na ahụ maka gburugburu bụ Sergio Costa, akpọọla oku ka amachie ịgba nta na mba ahụ.

Nwoke ahụ akpọghị aha ya na nna ya gbara afọ 34 ebe nna ya dị afọ 55.

Ha abụọ gara ị gba nta n'ọhịa iwu machiri ịgba nta mgbe ihe a mere n'ọhịa dịketere Postiglione.

Arsenal 3 - 2 Aston Villa

Image copyright Getty Images

Arsenal ji ọkpụ atọ asatara otu gbajie Aston Villa aka n'asọmpi Premia lig ụbọchị sọnde.

Aubameyang zọpụtara ndị Arsenal mgbe ọ fọrọ nkeji isii ka ọge gwụ mgbe ha na-agba onwe ha onye naba onye naba.

Arsenal zọrọ isi onwe ha azọ na ya bụ ọnọdụ ọkacha sị ebe ha dị mmadụ iri maka nchụpụ achụpụrụ onye otu ha bụ Maitland-Niles na ọkara nke ikpe azụ.

Gee akụkọ niile a na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile.

Akụko ga-amasi gị

Lee ihe nkiri ga-ekuziri gi ihe

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị bụ 'Cricket' n'asụsụ Igbo?