P&ID Nigeria: Malami, Lai Mohammed, Emefiele agaala ikpe udo na UK

Ikpe Naịjirịa na P&ID

Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti. Image copyright Twitter/@MalamiSan
Nkenke aha onyonyo Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti.

Ndị nnọchite anya gọọmentị etiti awụchiela na mba UK maka okwu gbasara akwụkwọ ụlọọrụ P&ID gbara Naịjirịa na-asị ka a kwụọ ha ijeri naịra itoolu na ụma.

Okaiwu ukwu nke gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami, Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohamed, na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu so wee mee njem a.

Ndị ọzọ gụnyere onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele, osote onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Lmorde, na onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka (EFCC) bụ Ibrahim Magu.

Ha gara ịmata ka a ga-esi jiri nwayọ dozie esemokwu dị n'etiti gọọmentị na ndị P&ID.

Ụlọọrụ Thomas Cook ekubiela

Image copyright PA
Nkenke aha onyonyo Ụlọọrụ Thomas Cook nwere ụgbọelu dị iri itoolu na anọ

Njinji ejiela n'obodo Eliza dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ime njem a kpọrọ Thomas Cook pịachiri ọrụ n'ụbọchị Mọnde.

Ụlọọrụ Thomas Cook nke malitere kamgbe afọ 1841 so n'otu ụlọọrụ a ma ama maka ịhaziri ndị mmadụ njem ụgbọelu ha.

Ọ dị ọtụtụ ihe mere ka ya bụ ụlọrọụ pịachie mana nke bụ isi sekpụ ntị bụ okwu ego.

N'ọnwa Mee afọ a, ụlọọrụ Thomas Cook kwupụtara ọghọm ruru otu ijeri paụnd na ụma ise (£1.5 billion).

Mbọ ikpeazụ ụlọọrụ ahụ gbara ka ha mara ma gọọmentị a ga-agbazinye ha ego dị narị nde paund abụọ na iri ise (£250 million) kụrụ afọ n'ala.

Nke a mere ka ụlọọrụ ahụ kubie.

Nkenke aha onyonyo Peter Fankhauser, onyeisi ụlọọrụ Thomas Cook

Onyeisi ya bụ ụlọọrụ bụ Peter Fankhauser kwuru na mmechi ha wutere ya n'obi nke ukwuu.

Mmechị ụlọọrụ ahụ ga emetụta ọrụ ndị mmadụ ruru puku iri abụọ na abụọ nke puku itoolu n'ime ha bụ ndị mba UK.

Gọọmentị Abịa akwụbeghi ndị dọkịta ụgwọ

Image copyright @okezieikpeazu
Nkenke aha onyonyo Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

Ndị dibia bekee na-arụ ọrụ na Abia State University Teaching Hospital eribeghi ụgwọ ọnwa kamgbe ọnwa iri na atọ gara aga.

Nnamdi Irondu bụ ọnụ na-ekwuru otu jịkọrọ ndị dibia bekee ahụ gwara BBC Igbo na ha-agbaala abụbụ ọrụ ugboro ugboro mana nke ahụ emeghi ka ọnọdụ ha gbanwee.

BBC Igbo kpọtụụrụ onye kọmishona na-ahụ maka mgbasa ozi n'Abia Steeti nakwa onyeisi ọrụ ntaakụkọ gọvano Okezie Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka ka ha tinye ọnụ n'okwu ahụ mana ha azabeghị anyị ruo ugbua.

Veberde a ga-ala?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ernesto Valverde, onye nkuzi ndị Barcelona

Onye nkuzi ndị otu bọọlụ Barcelona bụ Ernesto Velverde chị obi n'aka ugbua n'ihi ọnyụpa ndị otu ya na-agba.

Barcelona bụ ndị nke asatọ na tebulu La liga ugbua nke mere ka ndị mmadụ na-ekwu na a ga-achụ Velverde n'ọrụ.

Gee nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere m ejighi nwee TV na be m - Cosmas Maduka