Samson Siasia: Nne nwa amadị a ka nọkwa n'aka ndị ntọ kamgbe izuuka iri

Samson Siasia bụbu onye ntuziaka ndị Super Eagles Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nke a bụ nke ugboro abụọ a na-atọrọ nne Siasia, nke mbụ bụ n'afọ 2015.

Onye nkuzi ndị otu Super Eagles nke Naịjiria n'oge gara aga bụ Samson Siasia na-arịọ ka a gbatara ya ọsọ enyemaka maka nne ya ndị ntọrị nwụụrụ kamgbe izuụka iri gara aga.

Kamgbe abalị iri na ise nke ọnwa Julaị ka ndị ntọ gara nwụrụ nne Siasia na mmadụ abụọ ndị ọzọ n'obodo ha dị na Bayelsa Steeti.

Akụkọ kwuru na ndị ntọrị ahụ kpọrọ nnukwu aha ego ha chọrọ ka a kwụọ ha tupu ha atọhapụ ndị a.

Sịasịa sị n'obi agbawaala ya n'ihi na ahụ esichaghị nne ya ike bịa bụrụkwa na ndị uweojii amaghidi chaa chaa ndị tọọrọ ya.

N'okwu ya: "Onweghịzi ihe ọzọ m ma m ga-eme."

"Ndị uweojii kwuru na ọ rara ha ahụ ịchọta ndị ntọrị mere ihe a."

"A na m arịọ gọọmentị nakwa ala Naịjirịa nke m ji obi m niile fee, ka ha gbatara m ọsọ enyemaka".

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMaazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ.

Siasia kwuru na ya enwebeghị ọrụ ọbụla kamgbe afọ atọ gara aga, bịa tinyekwara mmachi nke otu Fifa machiri ya.

"Ihe niile agwụla m nnọọ ike."

Nke a bụ nke ugboro abụọ a na-atọrọ nne Siasia.

Nke mbụ bụ n'afọ 2015 ka ọ nọchara abalị iri na abụọ n'aka ha.

Atiku na Obi agaals "Supreme Court"

Image copyright Twitter/Obi/Secondus/Atiku
Nkenke aha onyonyo Uche Secondus, Abubakar Atiku, Peter Obi

Abubakar Atiku na Peter Obi na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ha bụ PDP eburula okwu gbasara onye meriri ntuliaka onyeisiala nke e mere n'ọnwa Februwarị afo pụọ ụlọikpe kachasị na Naịjiria.

Cheta na ụlọ ikpe mkpesa kụpụrụ ebubo nrụrụaka ha boro onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị otu ya bụ APC, ma kwuo na ọ bụ Buhari meriri ntuliaka ahụ n'ezie.

Nyenu anyị oche onyeisiala maọbụ Biafra

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPresidency 2023: A na-akpapụ ndị Igbo na Naịjirịa - Ezeife

Aka chiburu Anambara Steeti bụ Chukwuemeka Ezeife ekwuola na ndị okenye Igbo nwekwara ike ịdọnyere ndị otu IPOB ukwu ma ọ bụrụ na oche onyeisiala Naịjirịa erughị ndị Igbo aka n'afọ 2023.

Ezeife onye e ji Ọkwadike mara kwuru na ọ bụrụ eziokwu na Naịjiri bụ otu, onye Igbo kwesiri inweta ọkwa onyeisiala na ntuliaka nke 2023.

Na be Eliza

Nkenke aha onyonyo Boris Johnson, Praịm Mịnịsta mba Briten

Ụlọikpe ukwu n'obodo Eliza ekwuola na mmechi e mechiri ụlọomeiwu mba ahụ adabaghị adaba.

Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Boris Johnson kwuru na ya ekwenyeghi na mkpebi ahụ mana ọ ga-ehubere ya isi.

Gee akụkọ ndị na nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionSports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa