Chelsea vs Grimsby: Chelsea ejirila Grimsby kwụọ aka ka ha gbara ha 7-1

Ndị otu Chelsea Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Reece James gosiri na ọ bu eze ama na-aga echi

Ndi Chelsea egosila ihe ha ji bụrụ dike n'asọmpi iko EFL mgbe ha zutere ndị otu bọọlụ Grimsby na agba nke atọ ya bụ iko.

Ọ bụ nwaokoroọbia nke Chelsea bụ Reece James ka ndị mmadụ kpụ n'ọnụ mgbe agbachara asọmpi a.

James dị afọ iri na itolu nyere aka were hazie bọọlụ nke mere ka Batshuayi ji nye goolu nke abụọ na nkeji asaa.

Ọ bụ James nyekwara goolu nke ise ma hazie kwa bọọlụ ndị otu ya jiri nye goolu abụọ.

Onyenkuzi ndị Chelsea bụ Frank Lampard kwuru maka nwaamadi a were si "James egosila ihe ọ pụru ime, ọ nyere otu goolu ma hazie abụọ. n'uche obi m, ọ ga-abụ nnukwu mmadụ na chelsea maka na nke a ka bụ mbido ya" .

Dika o siri gaa, Ross Barkley kpuhere ite goolu ndị chelsea na nkeji anọ ebidochara asompi a.

Michy Batshuayi sitere na nhazi Reece James were mee ya abụọ.

Ndị Grimsby Town nwere olileanya mgbe Matt Green nyere otu goolu na nkeji nke iri na itolu.

Kama nke a dịka ọkpalịrị mụọ ndị Chelsea nke mere ka ha jiri Penariti sitere n'ụkwụ Pedro were mee ya goolu atọ na nkeji iri anọ na atọ.

N'agba nke abụọ n'asọmpị ahụ ka Kurt Zouma, Reece James, Batshuayi na Callum Hudson-Odoi jizi goolu otu otu were mezuo ya asaa zuru oke.

Dika ọ di ugbua, ha ga-ezute ndị otu bọọlụ Manchester United n'asọmpi ọzo n'iko EFL.

Kedụ ebe Sowore nọ?

Image copyright Sowore2019/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019

Ka chi na-efo, ndị ọkaiwu na ndị ezinaụlọ Omoyele Sowore nke akpọchiri lahụrụ n'isiụlọọrụ ndị uweojii pụrụiche bụ DSS dịka ha na-eche ka atọhapụ ya ka ụlọikpe si kwuo.

DSS ka jichiri Sowore n'ụlọ mkpọrọ n'agbanyeghị na ụlọikpe enyela iwu ka atọghapụ ya.

Enyinnaya Abaribe na ndị ụlọomeiwu gụnyere Abba Moro, Gabriel Suswam, Ibikunle Amosun na Solomon Adeola agbarụọla ihu

Ha kwuru na mgbachi gọọmentị gbachiri oke Naịjirịa na mba Benin na-ebute ntaramahụhụ nye ụmụ Naịjirịa na-azụ ahịa n'ebe ahụ.

Ị za okporoụzọ abụzị mmehie?

Image copyright Getty Images

Otu okpuruọchịchị na mba Italy eweghachila nha euro narị atọ n'ọma ha dara otu nwoke Naịjirịa maka ịzachapụ okporo ụzọ ha.

Nwoke ahụ aha ya bụ Monday kwuru na o họọrọ ịza okporoụzọ karịa ịrịọ arịrịọ.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Man Utd lara n'ezigbo nta ka ha kwotere ọnwụ site n'imerite penariti n'agbanyeghị na ndị ha zutere bụ otu egwuregwu ha kagburu akagbu

Ebe otu Chelsea jiri ọkpụ goolu asaa asatara otu wujuo nkata otu Grimsby mgbe ha zutere onwe ha.

Gee Nkeji ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Isiokwu Ndị Emetụtara