Independence day Nigeria : Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dinta na-achụ otu anụ - Trump

Akụkọ dị mkpa:

Trump ekelela Buhari na Naịjirịa

Onyeisiala Buhari na Traump
Nkenke aha onyonyo Ogbugbu ndị nso Kraist na-ewe Trump iwe

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump eziterela onyeisiala Muhammadu Buhari ekele ọma maka ncheta ụbọchị nnwereonwe Naịjirịa bụ ụbọchị mbụ ọnwa Ọktoba.

N'ozi ya, Trump sị na Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dịnta abụọ na-achụ otu anụ ọhịa n'ụzọ dị iche iche.

Ọ sị na Naịjirịa na Amerịka bụ enyi n'ibu agha megide iyi ndụ egwu n'ụwa dịka Boko Haram, ISIS na ndị ọzọ.

Trump sị na mba Amerịka dị njikere ịnabata atụmatụ ọchịchị Buhari n'ụzọ ga-enye aka iwulite mba abụọ ndị a.

Ọgbaaghara dara n'ụlọomeiwu ndị Bayelsa

Image copyright PROSPER DEKUMO

Ụda egbe na ọgbaaghara bụ ihe e ji gbasaa nzuko ndị ụlọomeiwu Bayelsa Steeti mere dịka ndị omekaome gbabatara n'ụlọomeiwu ahụ.

Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị omeiwu chọrọ ịchụtu onyeisi ha bụ Tonye Isenah , onye a sịrị chọrọ ịgba arụkwaghịm.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Manchester United ga-ele ndị Arsenal ọbịa n'Old Trafford n'asọmpi Premier League nke abalị a.

Ndị ọgba bọọlụ dịka Anthony Martial, Marcus Rashford, Alexandre Lacazette agaghị agba n'ihi mmerụ ahụ.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Agbagbuola onye uweojii n'Abia Steeti

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme

Ndị uweojii nọ n'Aba ekwuola na ha ka na-enyocha ka ha mara etu ndị ogbe ezu si gbuo onye otu ha.

Akụkọ pụtara n'ụbọchị Sepụtemba iri abụọ na asaa kwuru ndị oji egbe ezu wakporo ndị uweojii atọ na-eme nchekwa ngagharị gbuo otu,meruọ otu ahụ ebe onye nke atọ gbalagara.

Ndị oji egbe ezu ahụ jịkwa egbe ndị uweojii ahụ gbalaga.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ na steeti ahụ bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC Igbo na ya bu ihe mere mana ha ka na-enyocha ka ha mara ka mmiri si baa n'opi ugbogiri.

Anyị ga-ewetere ụnụ nchọpụta ha n'uju dịka ha kwere na nkwa ịgwa anyị ma ha mecha.

Ihe DSS mere Chido Onumah

Image copyright Chido Onumah Facebook

Ụlọọrụ Department of State Services (DSS) akọwala na onweghi mgbe ha ji nwụchi Chido Onumah bụ onye ntaakụkọ na-akatọ ọchịchị ọjọọ ma kwuo na ọ bụ ịtụziri ya aka ka ha mere.

Ọnụ na-ekwuchitere ngalaba a bụ Peter Afunanya kwuru na ọ bụ n'ihi efe o yi edere "anyị niile bụ Biafra" na ya bụ ihe kpatara okwu a.

Cheta na aakụkọ pụtara ụnayhụ na ndị DSS nwuchiri ya bụ nwamadi ụnyahụ ka ọ 'tụrụ down' n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe International airport dị n'Abuja.

Ha mechara wepụta akwụkwọ ozi gosiri na ọ bụ mkparịtaụka ga-eme ka akwa Onumah ghara ibutere ya nsogwu nakwa ụmụ Naịjirịa.

Ha kwuru na ụlọọrụ ha na-eme ihe ọbụla iji hụ na ha adaghị iwu Naịjirịa.

E nwere m olileanya na Naịjirịa ọhụrụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Osote onyeisiala Naịjirịa

Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ekwuola na na-agbanyeghị nsogwu niile Naịjirịa na-enwe , o nwere okwukwe maka Naịjirịa ọhụrụ ga ha pụta.

O kwuru nke a n'ụka a akara ụnyahụ iji malite emume ụbọchị ncheta nwereonwe nke Naịjirịa nke ugboro iri ise na itoolu.

Ide mmiri ataala isi mmadụ otu narị

Image copyright BBC HINDI

Ihe karịrị mmadụ narị anwụọla na mba India n'ihi oke ide mmiri na steeti Uttar Pradesh nakwa Bihar.

Ihe ndị ọzọ ide mmiri a metụtara bụ njem ụgbọala, ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ, ị ga ụlọakwụkwọ nakwa ọkụ latrik.

N'egwuregwu,

Image copyright IAAF twitter page

N'egwuregwu, Minista na-ahụ maka egwuregwu na mwulite ndị ntorobia bụ Sunday Dare enyela iwu ka akpọghachi onye na-elekọta ndị ọgbọsọ Naịjirịa bụ Sunday Adeleye.

Ọ bụ n'ihi emetaghị ọrụ ya ọfụma nakwa ịda iwu IAAF ka eji kpọghachi Adeleye.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri a ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIgbo Language: Gịnị bụ 'Comb' n'asụsụ Igbo?