Lion Heart: Ejije Genevieve Nnaji wepụtara nwere ike ituru ugo 'Oscar'

Akụkọ dị mkpa:

Genevieve Nnaji Image copyright Instagram/genevievennaji
Nkenke aha onyonyo Lion Heart bụ ejije izizi Gnevieve Nnaji mepụtara n'onwe ya.

Ihe ejije nke nwaada Igbo bụ Genevieve Nnaji mepụtara aha ya bụ 'Lion Heart' nwere ike ituru ugo 'Oscar'.

Otu a kpọrọ 'Nigerian Oscars Selection Committee' (NOSC) bụ ndị họpụtara ejije a ka o soro na ndị a ga-atule maka nturuugo 'Oscar'.

'Lion Heart' bụ ejije maka onye ọgaranya nwere ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọala.

Mgbe ụlọọrụ ahụ chọrọ imechi n'ihi ụgwọ ha ji otu ụlọakụ, ada ọgaranya ahụ gbalịrị ike ya iji hụ na-emechighi ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNollywood: 'Ihe nkiri Igbo ga-abụ egwu eji site na ntuziaka m na-eweta' - Ikeagwu

Otu n'ime ihe mmụta dị n'ejije a bụ na nwanyị bụ ihe.

Ndị a ma ama dịka Genevieve Nnaji, Pete Edochie, Nkem Owoh, Onyeka Onwenu, Kanayo Kanayo, Kalu Ikeagwu na oti egwu Phyno socha mee ya bụ ejije.

Buhari agaala Saụt Afrịka

Image copyright Twitter/Bashir Ahmed
Nkenke aha onyonyo Buhari n'ime ụgbọelu o ji aga Saụt Afrịka

Onyeisiala Muhammadu Buhari ahapụla Naịjiria taa bụ Wenezde gawa Saụt Afrịka.

Njem a bụ ka ya na onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa tinye ọnụ n'okwu gbasara 'Xenophobia'.

Ndị so Buhari mee nje m gunyere gọvanọ Kano steeti, Umaru Ganduje, Dave Umahi nke Ebonyi nakwa Simon Lalong nke Plateau.

Cheta na ndịisiala abụọ ahụ bu ụzọ zigara onwe ndị ozi gbasara ya bụ okwu.

A na-atụ anya na nzute Buhari na Ramaphosa ga-eweta okwu ịkpa oke agbụrụ n'isi njedebe maka na o si taa dịwa mma ọ dịwara gboo.

Ọzọkwa

Image copyright @bashirahmad
Nkenke aha onyonyo Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Lọndọn

Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla okwu na-efegharị na ọ na-akwado ịzọ ọkwa ọchịchị nke ugboro atọ

O si n'aka onye enyemaka ya pụrụiche na mgbasaozi bụ Garba Shehu kwuo na o nweghi mgbe ọ kwadoro ịgbanwe iwu ala ma kwuo na ọ ga-arịtu n'okwa mgbe oge ya gwụrụ n'afọ 2023.

Tambuwal na Ganduje enwetala mmeri

Image copyright TWITTER/@DAWISU
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Abdullahi Umar Ganduje

Ụlọikpe ntuliaka na Kano Steeti eweliela gọvanọ Umar Ganduje aka elu.

Ha kwuru na ọbụ Ganduje tuuru ugo n'ezie na ntuliaka oche gọvanọ e mere n'ọnwa Mach afọ a.

Image copyright Tambuwal/Facebook
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Aminu Tambuwal

N'otu aka ahụ, ụlọikpe ntuliaka nke Sokoto steeti kpebikwara na ọbụ Aminu Tambuwal meriri ntuliaka gọvanọ steeti ahụ taa.

Ikpe ahụ dị n'etiti gọvanọ Aminu Tambuwal nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' na Ahmed Aliyu nke otu 'All Progressives Congress'.

N'Enugwu,

Image copyright Ebere Amaraizu
Nkenke aha onyonyo Ndị mmadụ na Twitter na Facebook gbala ama na-awakporo ụmụnwaayị na Enugwu

Ndị uweojii na steeti ahụ anwụchiela mmadụ iri na ise bụ ndị na-echụ ndị steeti ahụ ụra site n'akparamagwa dị icheiche.

Ụfọdụ ihe anatara ndị a bụ egbe anọ, ụgbọala atọ nakwa ekwentị iri na atọ.

N'ofesi

Mba Amerịka amachiela ntụbata ọla dayamọnd site n'obodo Zimbabwe.

Iwe ha bụ na Zimbabwe na-amanye ndị mmadụ amanye ịrụ ọrụ n'ebe a na-egwuputa 'diamond' ndị ahụ.

Mana ndị ọchịchị Zimbabwe kwuru na Amerịka asigbuola onwe ha n'asị, maka na onweghị onye ha manyere ka ọ rụọ ọrụ ebe ahụ.

Jamal Khashoggi

Nkenke aha onyonyo Jamal Khashoggi

Taa ka o mere otu afọ e ji gbuo Jamal Khashoggi onye ntaakụkọ si mba Saudi Arebia.

N'ụbọchị Wenezdee, ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ihu ụlọ embasi ndị Saụdi Arebia nke dị na mba Tọkị.

Ọ bụ n'ime embasi ahụ ka a nọ gbuo Khashoggi n'afọ gara aga.

Hatice Cengiz, onye Khashoggi chọbụrụ ịlụ, na-akpọ oku ka ejide ndị gburu ya ma maa ha ikpe.

A na-ebo ọkparaeze ndị Saudi Arebia bụ Mohammed bin Salman ebubo na aka ya dị n'ọnwụ Khashoggi.

Mana ọ gọrọla ọnụ ya na aka ya adịghị ya.

Ọkparaeze Harry agbarụọla ihu

Image copyright EPA

Ọkparaeze Harry eforola ntụtụ taa n'ihe gbasara nwunye ya bụ Meghan Markle

Ọ kọwara na ọ ga-akpụpụ ụlọọrụ mgbasaozi Mail on Sunday ụlọikpe iji gbochi ihe mere nne ya bụ Lady Diana ịme nwunye ya.

N'egweregwu

Image copyright Twitter/Champions League

Asọmpi UEFA Champions League ka na-agakwa n'ihu.

Otu egwu bọọlụ Liverpool, Chelsea, Barcelona, Inter Milan na ndị ọzọ ga-apịrị ya n'abalị taa

N'asọmpị nke ụnyaahụ, Bayern Munich ji goolu asaa asatara abụọ saa Tottenham ahụ.

Manchester City meriri Dinamo Zagreb 2-0, Real Madrid na Club Brugge gbara onwe ha 2-2.

Okwu Tammy Abraham na Fikayo Tomori

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles

Aka na-achịkọta otu Super Eagles bụ Gernot Rohr agwaala BBC na ọ gaghị etinye ndị ọgba bọọlụ abụọ bụ Tammy Abraham na Fikayo Tomori n'otu Naịjirịa ugbua.

Abraham na Tomori bụ ndị ọgba bọọlụ a mụrụ na mba Ingland agbabugoro England bọọlụ mbụ.

Gee Nkeji ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe onyonyo ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionYouths Talk: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na inwe ohere ichi Naịjirịa?