Tammy Abraham: Otu nkwọ Ọnịcha amaghị na otu onye abịaghị ahịa - Kanu Nwankwo

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Fikayo Tomori na Tammy Abraham

Otu nkwọ Ọnịcha amaghị na otu onye abịaghị ahịa

Nke a bụ ihe Kanu Nwankwo nwere ikwu gbasara ọkpụkpọ ndị otu egwu bọọlụ nke mba Ịngland kpọrọ Tammy Abraham na Fikayo Tomori ka ha gbaara ha bọọlụ.

Abraham na Tomori bụ ụmụ Naịjirịa. Ha na-agbara otu egwu bọọlụ Chelsea.

Ha agbaarala Ịngland bọọlụ n'ogoogo ndị erubeghi afọ 21.

Onye nkuzi bọọlụ nke mba Ịngland bụ Gareth Southgate kpọrọ Abraham na Tomori ka ha soro gbaa bọọlụ mgbe Ịngland ga-ezute mba Chek Rịpọblik n'ọnwa Ọktoba a.

Nke a pụtara na ha abụọ agaghị enwe ike ịgbara Naịjirịa bọọlụ ọzọ.

Mana Kanu Nwankwo kwuru na nke ahụ enweghị ihe o mere.

Nwankwo Kanu Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nwankwo Kanu mgbe ọ ka nọ n'egwu.

Dịka o si gwa ụlọọrụ ntaakụkọ Goal.com, Nwankwo kwuru na Naịjiria nwere ndị bọọlụ ọka nkụ.

"Anyị agaghị arịọ onye ọbụla arịọ ka ọ gbaara Naịjirịa bọọlụ."

"Ọbụ ndị mmadụ kwesịrị ịrịọ ka ha gbaara Naịjirịa bọọlụ."

"Naịjirịa nwere ndị ma agba bọọlụ ọka nkụ."

"Ndị anyị nwere ga-ezu inye anyị mmeri n'asọmpi ọbụla."

Ịngland ga-ezute Chek Rịpọblik n'abali iri na otu.

Naịjirịa na Brazil ga-ezute n'asọmpi enyi na enyi n'abalị iri na atọ nke ọnwa Ọktoba.

Lee etu mba Kenya si ebuso nrụrụaka agha

Akwụkwọ ego 1000 shillings nke Kenya Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Akwụkwọ ego 1000 shillings nke Kenya

Gọọmentị Kenya ekwuola na atụmatụ ha wepụtara iji wepụ akwụkwọ ego ochie otu puku shilling maka iji gbochie nrụrụaka, gara nke ọma.

Ha kwuru na ihe ruru mmadụ pasentị iri itoolu na asaa eweghachila nke ha, nke pụtara na onye ọbụla ka ji akwụkwọ ego otu puku shilling nke ochie ugbua, jizi akwụkwọ nkịtị.

"Anyị agaghị ekwe nkwa anyị agaghị emezunwu"

Ngige Image copyright Ngige twitter handle

Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na gọọmentị etiti agaghị ekwe nkwa ha agaghị emezunwu.

O kwuru nke a ebe ọ na-arịọ ka ndị ọru nabata atụmatụ gọọmentị wepụtere iji tinye ego n'ụgwo ọnwa.

Ngige sị na atụmatụ ahụ dị mma maka ha mefee oke, ọ bata n'ịchụ ndị mmadụ n'ọrụ.

Nke a na-abịa dịka otu NLC bụ ndị na-elekọta ndị ọrụ na-akwado ịgba abụbụ ọrụ n'izu abụọ na-abịa.

Image copyright Twitter
Nkenke aha onyonyo President Cyril Ramaphosa meet President Muhammadu Buhari

Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwuola ihe gọọmentị ya bu n'uche maka ụmụ Naịjirịa bi na mba ahụ.

O kwuru na ọ ga-anwa ike ya niile iji hụ na mwakpo Xenophobia ga-abịa na njedebe.

Okwu ya nke a sị na mkparịtaụka ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị ntaakụkọ nwere na Pretoria n'ụbọchị Tọzde.

Okwu ụgha na Facebook

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị

Facebook amalitela iwepu akara ndị ha sị na ekesa asị na intanetị, ọkachasi ndị nọ na United Arab Emirates, Ijipt nakwa Naịjirịa.

Facebook sị na akara ndị ha wepụru bu nke ndị mmadụ hiwere iji na-aghọrị ndị mmadụ site na-ikesasị akụkọ ụgha.

Na mba ofesi

Onyeisiala mba Cameroon bụ Paul Biya enyeela iwu ka atọghapụ mmadụ nari atọ na iri atọ no n'ụlọ mkpọrọ.

Ndị a atọghapụrụ so n'ime ndị si mpaghara ọdịda anyanwụ mba ahụ eji maka ọgbaghara metutara mwereonwe ha.

N'Egwuregwu,

Chukwuebuka Enekwechi abụrụla onye Naịjirịa mbụ ruru agba nke ikpeazu na asọmụnpị ịtụ ọkpụ okwute Bekee kpọrọ "shot put".

Enekwechi tụtara centimetre iri abụọ na ọma iji tozue n'asọmpị IAAF a na-agba na Qatar.

Gee Nkeji ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji