Buhari's South Africa Visit: Ndị Ipob sị na ndị uweojii wakporo ha

IPOB Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti

Ihe onyonyo e tinyere na soshal midia na-egosi ọtụtụ ndị otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bucha apa n'ahụ ha nke ha sị sitere na mgbọ egbe ndị uweojii Saụt Afrịka wụrụ ha.

Ndị Ipob a gara ime ngagharịiwe n'Obodo Pretoria dịka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari gara njem nleta na Saụt Afrịka.

Ndị Ipob bụ ndị na-achọ ka ekewaa Naịjịrịa kewapụta Biafra.

Ha na-emekarị ngagharịiwe ebe ọbụla onyeisiala Buhari gara njem.

Mana Naịjirịa tinyere aha Ipob n'akwụkwọ ha ji ede ndị ha sị bụ ndị oyi egwu.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRochas: Ipob na Biafra abụghị otu ihe

Mgbe BBC Igbo kpọrọ onye na-ahụ maka ndị Naịjirịa na Saụt Afrịka bụ Godwin Adama, ọ sị na ya enweghị ike itinye ọnụ na ya bụ okwu ugbua.

"Enweghị m ike ikwu maka ihe ahụ ugbua. Anyị na-akwado ịga rie oriri na be Onyeisiala Saụt Afrịka ugbua."

Maazị Adama gara n'ihu kwuo na njem Onyeisiala Buhari na-aga ọfụma.

Mana otu onye Ipob n'Abuja aha ya bụ Ụkọchukwu Peace gwara BBC Igbo na ọ bụ ezigbo mgbọ ka ndị uweojii Saụt Afrịka ji gbaa ndi otu ha.

Ọ sị; "E burula mmadụ abụọ agbaturu gawa ụlọọgwụ."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe bụ iwe anyị taa - Ụkọchukwu Peace

Agbanyeghi nke a, ụfọdụ ndị Ipob na soshal media kwuru na o bụ mgbọ rọba ka ndị uweojii jiri chụsasịa ha ebe ha na-eme ngagharịiwe.

Ihe nkiri e tinyere na soshal midia gosikwara ụfọdụ ndị bu apa egbe dị ka nke rọba ndị uweojii Saụt Afrịka ji achụsa ndi na-eme ngagahrị iwe.

BBC Igbo gbara mbọ inweta ndị uweojii Saụt Afrịka n'ekwe ntị mana ha azaghị.

Akara soshal midia ha enweghịkwa ihe ọbụla metụtara ndị Ipob dị na ya ruo mgbe akụkọ a pụrụ.

Akụkọ a ka dị n'elu, anyị na-esosị ya n'ike.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Onweghi onye ga-awakpo nwa Abia steeti gbara aka laa'