Chibok Girls: Ha anọọla ụbọchị 2000 n'aka Boko Haram

Akụkọ dị mkpa:

Ụmụaka Chibok anọọla ụbọchị 2000 n'aka Boko Haram

Image copyright BBOG/Twitter

Otu Bring Back Our Girls na ndị nne na nna etiela mkpu n'oke olu maka ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị Chibok ka nọ n'aka ndị Boko Haram kamgbe ihe karịrị afọ ise.

Ha na-ebe akwa na gọọmentị achọghị ịgba mbọ ka a tọhapụ ụmụaka 112 fọrọ afọ n'ime ihe karịrị 200 a tọọrọ.

Otu a riri uju iji chetara ụbọchi puku abụọ ụmụaka ndị nọrọla n'aka ndị Boko Haram bụ ndị tọrọ ha n'ụbọchị 14 Eprelu, 2014.

Otu BBOG wepụtara akpụkpụ dị 112 e dere aha ụmụaka ndị a, nke Leah sheribu na ndị ọrụ enyemaka abụọ Alice Ngaddah na Grace Taku.

Ha gosiri akpụkpụ ụkwu ndị a n'ogige Unity Fountain dị n'Abụja n'ụbọchị Satọde bụ abalị ise nke ọnwa Ọktoba afọ 2019.

Nyesom Wike emeriela n'ụlọikpe

Image copyright Other

Ụlọikpe dị na Rivas Steeti ekwuola n'ezie na ọ bụ gọvanọ Nyesom Wike meriri na ntuliaka afọ 2019 dịka ọkaikpe K.A Ojiako si kwuo.

Ụlọikpe a sị na onye ji aha ADP zọọ ọkwa gọvanọ mere mkpesa bụ Victor Fingesi ga-akwụ ụlọọrụ Inec, gọvanọ Wike na PDP ego dị puku narị naịra atọ n'otu n'otu.

N'ofesi

Image copyright Reuters

Ihe ruru mmadụ otu narị anwụọla na ngagharịiwe na-eme na mba Iraq megide gọọmentị ha.

ebe ihe karịrị mmadụ puku atọ merụrụla ahụ n'ọgbaghaara ahụ.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Tottenham makwara afọ n'ala ọzọ dịka Brighton ji ọkpụ goolu atọ saa ha ahụ n'asọmpi Premier league

Nke a ga-eme ugboro atọ a ga-emeri ha n'ime otu izuụka.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ọ bụ ndị Uweojii gbara gbara ụlọ anyị ọkụ'

Onyeisiala Buhari na ụmụ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka

Image copyright Bashir Ahmaad
Nkenke aha onyonyo Ụmụ Naịjirịa ha na onyeisiala Buhari nwere ọgbakọ na Saụt Afrịka

Osote odeakwụkwọ ndị otu a kpọrọ onwe ha Nigerian Citizens Association in South Afrika tiri mkpụ a na nzụkọ mkpuru ha na onyeisiala nwere na Saụt Afrịka.N'ofesi, Ụmụ Naịjirịa gbakọrọ na mba Saụt Afrika ịzụte Onyeisiala Muhamdu Buhari ebesalara ya akwa arịrị maka ụdị mkpagbu na mkpachapụ chere ha n'ihu na mba ahụ.

Osote odeakwụkwọ ndị otu a kpọrọ onwe ha Nigerian Citizens Association in South Afrika bụ S J Uba tiri mkpụ a na nzụkọ mkpuru ha na onyeisiala nwere na Saụt Afrịka.

Ndị otu a gwara Buhari na ndị uweojii, ndị ọrụ nchekwa na dị mba ahụ na elegere ndị Naịjirịa anya ka ndị ekperima.

Ihe ọzọ pụtara na njem Saụta Afrịka onyeisiala mere bụ na mba abụọ ahụ ekwekọrịtala ị na enye visa afọ iri n'ofu nje maka ndị ọchụnta ego, ụmụakwụkwọ na ndị na-emekarị njem.

Nasir El-Rufai sị na ụmụaka ahụ atọọrọ ga-apụata

Image copyright Twitter/El-Rufai

Ụnụ anụkwanụ e, na ndị ntọ tọọrọ ụmụ agbọghọ isii n'ụlọakwụkwọ dị na akụkụ Kaduna ụbọchị tọzde akpọọla okwu aha ihe a ga-enye ha tupu ha tọhapụ ụmụaka ahụ.

Gọvanọ steeti ahụ bụ Nasir El-Rufai sị na ha na ndị ahụ na-ekweọnụ, mana o kwughị egoole ha kpọrọ aha.

Ụmụ Aba ka na-ebe maka ọkụ agbara

Ndị mmadụ na mpagaghara Aba ka na-eti mkpu maka mkpamkpa ha sị na ndi uweojii kpara n'ogige ha n'izu a.

Ọfọdụ ndị agbara akụnaụba ha ọkụ sị na ndị uweojii ha sị kpara ike a bịara njem mmebi ihe ruo ugboro ano kemgbe nsogbu a malitereka dịka ndị amatabeghị gburu onye uweojii.

Onyeisi ndi uweojii n'Abịa bụ Eneh Okon na-agọ na ọbụghị ndị ọrụ ya mere ihe a.

Egwu họrọ Dele Alli

Image copyright Press Association

N'egwuregwu, egwu ahọọla nwafọ Naịjrịa na-agbara Ingladị bụ Dele Alli n'asọmpi Urop 2020.

Nke a dị na-akwụkwọ onye nkuzi Inglandi bụ Gareth Southgate biputara n'izu a.

Gee akụkọ ndị niile n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Akụkọ ga-amasị gị