2020 Bugdet: Buharị ga-ebupute akwụkwọ etu gọọmenti ga-esi mefu ego n'afọ na-abịanụ

Buhari Image copyright Twitter @BashirAhmaad

Onyeisiala Buhari ga-ebugara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ gọọmenti ga-eji mefu akụ na ụba n'afọ 2020 taa.

Buhari ga-ebupute ya bụ akwụkwọ n'ụlọomeiwu nta.

Ya bụ mmemme ga-amalite n'elekere abụọ nke ehihie taa.

N'ụbọchị monde bụkwa ụbọchị asaa nke ọnwa Oktoba ka ndị otu 'Federal Executive Council' nwere ọgbakọ iji hazicha ọfụma ihe gbasara ya bụ akwụkwọ mmefu ego.

N'izu ụka gara aga ka Buhari nwere akwụkwọ nke bekee kpọrọ "2020 Medium Term plan document, Medium Term Expenditure Framework (MTEF) and Fiscal Strategy Paper (FSP)" buga na Sineti.

Akụkọ na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa agbaala ya bụ ụlọomeiwu okirikiri ma di njikere inabata ma mee ndị ga-abịa emume ahụ ezi nyocha tupu anabata ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara