Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gbasara budget 2020

Buhari na-agwa ndịomeiwu okwu. Image copyright Twitter/BashirAhmad

Okwu gbasara atụmatụ mkpata na mmefu ego nke Naịjirịa n'afọ 2020 ka na-ewu n'elu na ala.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-eto onyeisiala Muhammadu Buhari maka iwepụta ya bụ atụmatụ n'oge.

Buharị kwuru na ego dị tarị naịra iri na ụma atọ (N10.3 trillion) ka Naịjirịa ga-emefu n'afọ na-abịa abịa.

E kere ego a ụzọ abụọ, nke a ga-eji arụpụta ọrụ a hụrụ anya (capital expenditure) nakwa nke a ga-eji egbo mkpa na-adpụta kwa mgbe kwa mgbe (recurrent expenditure).

Ego e ji egbo mkpa dị tarị anọ na ụma asatọ ebe nke e ji arụpụta ihe a na-ahụ anya dị tarị abụọ na otu ụma.

Mana ụfọdụ na-atamu ntamu na-ekwu na ego e wepụtara maka ụfọdụ ngalaba dị mkpa pere mpe.

Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ maka bọjetị 2020:

1) Ego mbite

Image copyright Getty Images

Ihe karịrị tarị naịra abụọ na ụma (N2.18 trillion) ka a ga-ebite ebite maka bọjetị nke afọ 2020.

Nke a ka bekee kpọrọ 'Budget Deficit'.

2) Ego e ji ete ụgwọ mmanụ

Onyeisiala kwukwara na ihe karịrị tarị naịra abụọ na ụma anọ (N2.45 trillion) ka e wepụtara iji tee ụgwọ Naịjiria ji mmanụ.

Bekee kpọrọ nke a 'debt servicing'.

3) Mịnịstrị ahụike enweteghị ihe ọtụtụ tụrụ anya

Image copyright Getty Images

Ego onyeisiala wepụtara iji mepụta ihe a hụrụ anya na mịnịstrị ahụike n'afọ 2020 bụ ijeri naịra iri anọ na isii (N46bn).

Nke a ka a na-akpọ 'capital expenditure' na bekee.

Ego nke afọ a pere mpe karịa nke afọ gara aga.

Afọ gara aga, mịnịstrị ahụike nwetara ego dị ijeri naịra iri ise na otu (N51bn).

Ngalaba agụmakwụkwọ nwetara ijeri naịra iri anọ na asatọ (N48bn), ebe ngalaba nchekwa nwetara otu narị ijeri naịra (N100bn).

4) VAT arịala n'ezie

A nubuola kepu kepu na gọọmentị etiti ga-ebuli ụtụisi nke a kpọrọ VAT, mana onyeisial kwuziri ya hoo haa.

O kwuru na VAT arịala site na pasentị ise ruo pasentị asaa na ụma ise.

Dịka Buhari si kwuo, ego e tinyere na VAT ka a ga-eji ewulite ọnọdụ ahụike nakwa agụmakwụkwọ na Naịjirịa.

5) Bojetị ga-amalite Janụwarị

Image copyright Twitter/BashirAhmad

Buhari kwuru na ihe ya ji wepụta Bọjetị 2020 ugbua bụ iji hụ na ndị omeiwu mechara ihe dị na ya tupu afọ a agwụ.

N'otu aka ahụ, ndịomeiwu kwuru na ha ga-eme ka atụmatụ onyeisiala nwee isi.

Nke a mee, ọ ga-abụ nke mbụ bọjetị afọ ọbụla na-amalite na-abalị mbụ nke ọnwa Janụwarị afọ ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRochas Okorocha: Ọ bụrụ na asị m pụọ na Senate ka Naịjirịa dị mma, aga m apụ