Sex for Grades: Mahadum Rivers enyela ụmụakwụkwọ akara ekwentị maka mkpesa ndị na-edina ha

Akụkọ dị mkpa:

Mahadum Rivas Steeti akara ekwentị maka mkpesa

Ọkammụta Opuenebo Binya Owei
Nkenke aha onyonyo Mahadum Rivas Steeti dị mbụ nwee ukporo iwu ụmụakwụkwọ ga-eji mee mkpesa banyere nke a mana ụjọ anaghị ekwe ha mee ya.

Mahadum Rivas Steeti ewepụtala akara ekwentị ebe ụmụakwụkwọ ga-eme mkpesa maka ndị nkuzi na-achọ idina ha.

Nke a na-abịa n'ime ụbọchị atọ BBC wepụtara akụkọ maka nyocha ndị nkuzi mahadum na-edina ụmụakwụkwọ na mpaghara Afrịka (Mahadum Legọs na Gana).

Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi mahadum a bụ Ọkammụta Opuenebo Binya Owei gwara BBC na ọ bụ ka ụmụakwụkwọ nwee ike ịkpọpụta ndị nkuzi na-akpa ụdị arụ a.

Ọ sị na ihe mere o ji bụrụ ihe nzuzo bụ ka ụmụakwụkwọ ghara ịtụ ụjọ ihe ga-eme ha ma ha kpọọ onye nkuzi aha.

Mahadum a so na dị a kpọrọ aha na soshal midia ka e nyocha ndị nkuzi ha maka idina ụmụakwụkwọ.

Buhari na Jonathan Zutere n'Aso Rock taa:

Image copyright @BayoOmoboriwo

Ihụkwara Foto Onyeisiala Muhammadu Buhari na Goodluck Jonathan ebe ha na-ekwe n'aka na-achị ọchị n'Asọ Rock.

Nke a mere mgbe Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa nyefere Buharị ọchịchị n'aka gara n'isi ọchịchị Naịjirịa dị n'Abuja.

O nweghi onye mara ihe bụ isi mkparịtaụka ime ụlọ ha mere were nkeji iri dịka Jonathan.

Nke a butere ọtụtụ okwu na soshal midia nke otu onye na Facebook sị na 'ọ dịka Jonathan ọ chọwala ịbanye APC'.

Na Sudan

Nwada Neemat Abdulllah abụrụla onyeisi ọkaikpe nwaanyị mbụ na Sudan

Ọ dịla anya ọtụtụ mmadụ na-achọ ka e nyekwuo ụmụnwaanyị ọkwa dị elu na mba ahụ.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionWorld Mental Health Day: 'Obi ịdamba mere ka m chere na igbu onwe m kara m mma'

'Innoson Motors' e bunyere Mercy BBNaija ebutela ụka na soshal midia

Image copyright Twitter/innosonvehicles
Nkenke aha onyonyo Ụgbọala Innoson Motors BBNaịja bunyere Mercy

Dịka Mercy Eke, onye e ji Lamborghini wee mara nwetachara mmeri n'egwuregwu Big Brother Naija, okwu gbasara ihe nrite e nyere ya ka na-ewu na sosha midia.

Mercy ritere ego dị nde naịra iri atọ na ihe nrite ndị ọzọ ọnụ ego ha ga-erukwa nde naịra iri atọ.

Otu n'ime ihe nrite ndị a bụ ụgbọala Innoson Motors.

Mana otu onye a ma ama na soshal midia bụ Tunde Ednot kwuru na Innoson Motors e bunyere Mercy ekwesighị ekwesị.

Ednut kwuru na ya che na a ga-ebunye Mercy ụgbọala 'G-wagon' maọbụ 'Range'.

Mana Ednut mechara wepu ihe ahụ o dere n'akara 'intsgram' ya.

Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ihe ahụ Ednut kwuru.

Ha sịrị na ọ magburu onwe ya bụ ụgbọala Innoson Motors e bunyere Mercy n'ihi na ọ ga-enye aka ịịkwalite ụgbọala a rụrụ na Naịjirịa.

Mana ụfọdụ na-ekwu na ụgbọala ahụ erughị nde naịra iri abụọ na ise bụ ego ole ndị BBNaija kwuru na ha zụrụ ya.

Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ kwuru:

@DrJoeAbah kwuru na ọ zụrụ ụgbọala Innoson n'ihi na ọ dị mma.

@realVirusMedia kwuru na ọdịghị ya ka ụgbọala ahụ e bunyere Mercy eruru ego ole e kwuru na a zụrụ ya.

@youngsam_my kwuru na ụgbọala Innoson Motors zuru ka e mee.

Ụlọọrụ Innoson Motors tinyekwara ọnụ n'okwu ahụ.

He kwuru na ha na-agba mbọ ịkawanye mma dị oge na-aga.

N'akụkọ ọzọ

Image copyright Nigerian senate

Dịka BBC gbachara ndị nkuzi mahadum na-achọ idina ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị n'anwụ, ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa amalitela itule iwu ọhụrụ ga-eme ka onye ọbụla mere ụdị omume ahụ ọzọ gaa nga afọ ise.

Onye na-akwado iwu a bụ Ovie Omo-Agege onye bụ osote onyeisi Senate ma bụrụkwa sịnetọ na-anọchite anya Delta Central n'ụlọomeiwu ukwu.

N'ofesi

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Nabil Karoui na-ekele ndị nkwado ya

Ụlọikpe na mba Tunisia atọhapụla Nabil Karoui bụ onye so azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a ga-eme na mba ahụ ụbọchị ụka.

Karoui nobu na mkpọrọ n'ihi ebubo nrụrụaka na iji aghụghọ zere ịtụ ụtụisi, mana ọ na-ekwusi ike na aka ya dị ọcha.

N'egwuregwu

Image copyright Twitter/thenff
Nkenke aha onyonyo Aha a na-akpọ ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa na-erubeghị afọ iri na-asaa bụ 'Golden Eaglets'.

Ndị otu egwu bọọlụ Naịjiria na-erubeghị afọ iri na asaa agawala mba Brazil iji sonye n'asọmpi iko mba ụwa maka ndị na-erubeghị afọ iri na asaa.

Asọmpi a ga-ebiri ọkụ bido n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba ruo abalị iri na asaaa nke ọnwa Novemba.

Image copyright Fifa.com
Nkenke aha onyonyo Naịjiria nọ n'otu B n'asọmpi nke afọ a

Naịjirịa abuola iko mba ụwa ndị na-erubeghị afọ iri na asaa ugboro ise.

Ha gunyere nke afọ 1985, 1993, 2007, 2013, na 2015.

Naịjirịa, Họngarị, Ekuadọ na Ọstrelia nọ n'ọtu B n'asọmpi nke afọ a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị ka ị ma gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị?