Sadiya Umar Farouq: Mụ na Buhari? Nke a bụ asịrị

Sadiya Umar Farouq Image copyright Sadiya Umar Farouq

Dịka ka akụko na efeghari na Sadiya Umar Farouq na onyeisiala ga-agba akwụkwọ taa.

BBC jụrụ onye enyemaka ya ma eziokwu o dị n'akụkọ a .

Ọ gwara BBC na akụkọ ahụ bụ ezigbote asi.

Kedu Onye bụ Sadiya Umar Farouq?

Sadiya Umar Farouq bụ Mịnista na-ahụ maka ihe gbasara mmadụ, ọrụ gbata gbata na mmekọrịta madụ na ibe ya.

Bekee kpọrọ ngalaba ahụ 'Ministry of Humanitarian Affairs, Disaster Management and Social Development'.

Nke a bụ otu n'ime ndị ngalaba onyeisiala Muhammadu Buharị kewapụtara ọhụrụ n'afọ a.

A mụrụ Sadiya Umar Farouq na Nọvemba 5, 1974.

Ọ bụ onye Zamfara steeti n'okpuru ọchịchị Zurmi dị na mpaghara ugwu nke Naijirịa.

Ọ gara akwụkwọ Sekọndịrị na 'Federal Girls college' nke dị na Gusau, Zamfara steeti.

Ọ nwere asambodo "Business Administration" na mahadum nke Ahmadu Bello Zaria, Kaduna Steeti.

O nwekwara asambodo osote ọkammụta na "International Affairs and Diplomacy" ma tinyekwa nke "Business Administration" (MBA) sitere na Mahadum Ahmadu Bello.

Farouq bụbu onyeisi ngalaba na-elekọta ndị gbatara ọsọ ndụ na Naịjirịa nakwa ndị enwghị ebe obibi n'ihi agha maọbụ ihe ndapụta.

Ọ ruburu ọrụ dịka onye ojide ego ndị 'All Progressive Congress' site n'Ọnwa Jun 2013 ruo Jun 2014.

O sokwa na ngalaba nke APC hụrụ maka nhọpụta Buharị dịka ọnyeisiala Naijirịa.

Farouq bụkwa onye ojide ego otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Congress for Progressive Change' ebe Buhari nọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2011.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara