Kaduna kidnapping: Ndịagha azọpụtala ụmụakwụkwọ 6 atọrọ n'ụbọchị tụzde na Kaduna steeti

Egbe a natara ndị omekome na Kadụna Steeti.

Ndị agha Naịjirịa anya na-acha ọkụ bụ ndị 'Operation Thunder Strike' azọpụtala ụmụakwụkwo atọrọ ma memila ndị ntọrọ tọrọ ha.

Ụmụakwụkwọ a bụ ndị na-agụ na 'Government Day secondary school' Gwagwada nke dị n'okpuruọchịchị Chikun na-aga akwụkwo n'ụbọchị Tụzde mgbe ndị ntọrọ a tọrọ ha.

Ndịagha a na-eme ngagharị nchekwa okporoụzọ mgbe ha nwetere ozi na ndi omekome na-awakpo ndi mmadụ n'okporoụzọ Abụja - Kaduna.

Ndịagha egbughị oge dịka ha wakporo ndị ntọrọ a ma gbuo otu n'ime ha ebe ndi ọzo jị ọnya mgbọ egbe gbaba n'ime ọhia.

Etu a ga ha siri were zọpụta ụmụ akwụkwo isii ndia nille ma naputa ndi omekome a otu egbe 'AK-47', mgbo egbe pụrụiche asaa nke "7.62mm" na egbe 'Pump action' na mgbọ iri so ya.

Nkenke aha onyonyo Egbe a natara ndị omekome na Kadụna Steeti.

Ndiagha a gara n'ihu chebiri ndị ntọro a na Soho Gaya nke dị na okpuru ọchichị Chikun n'ihe dịka elekere nke iri n'ụtụtụ.

Nchebiri ndiagha mụtara mkpụru dika ha gburu otu onye omekaome a ma natakwa ha otu egbe rifụl, gbụo ndị omekaome abụọ ma natakwa ha egbe AK 47 abụọ, otu egbe 'Pump action' na mkpo mgbo egbe atọ.

Meria kpalịri mụọ ndịagha, ebe onyeisi ndịagha nke 'Commanding Division 1' bụ Major General Faruk Yahaya toro ha ma gbaa ha ume ka ha jisie ike memilaa ndị omekome niile no na mpaghara ahụ.

Dịka ọ dị ụgbụa, ndịagha Naịjirịa ka na-achọ ndị ntọ na ndị omekaome n'ime ọhia nke dị na mpaghara ebe ha wakporo ndị ntọrị a.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRochas Okorocha: Ọ bụrụ na asị m pụọ na Senate ka Naịjirịa dị mma, aga m apụ