Super Eagles: Naanị ụgwọ otu ọnwa ka Naịjirịa ji Gernot Rohr - NFF

Akụkọ dị mkpa:

Ụgwọ anyị ji Rohr bụ naanị otu ọnwa:

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles

Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigerian Football Federation' ekwuola na ha ji onye nchịkọta ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr ụgwọ otu ọnwa (Seputemba).

N'ozi si n'akara twitter ha pụta sị na ọ bụ naanị ọbụghị ụgwọ ọnwa atọ dịka akụkọ na-efegharị si kwuo.

Otu NFF gara n'ihu kwuo na ha na-agba mbọ ịhụ na a kwụrụ Gernot Rohr ụgwọ a n'egbughi oge

'Anyị chọrọ iwu kajara akaja make ikpuchi ụmụnwaanyị'

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na Naịjirịa chọrọ iwu siri ike iji megide mmegbu na mwakpo ụmụnwaanyị na ala.

Onyeisiala Buhari kwuru nke a n'ime ụbọchị anọ BBC wepụtara akụkọ nyocha gosiri ndị nkuzi na mpaghara Afrịka na-achọ idina ụmụakwụkwọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌka mmụta Boniface Igbenehue

Buhari nyere ndị ọrụ nchekwa nakwa ndịisi ụlọakwụkwọ ndụmọdụ ka ha gbaa mbọ hụ na a tara ndị na-awakpo ụmụnwaanyị ahụhụ dịrị ha.

Ọ sịrị ka ndị mmadụ ghara ịkọ ndị a wakporo ọnụ ma ọ bụ ime ha ihe ihere nakwa ka ezinaụlọ ndị a kwupụta ụdị ọnọdụ a.

Nke a bụ okwu mbụ Buhari na-ekwu banyere ụdị ọnọdụ a.

Nobel Peace Prize nke afọ 2019

Image copyright Reuters

E chiela Abiy Ahmad bụ Praịm mịnịsta mba Ethiopia eze udo nke mbụ dịka o turuugo nrite Nobel Peace Price nke afọ 2019

Echichi a bụ maka mbọ ọ gbara n'ime udo n'etiti mba Ethiopa na Eritrea n'ime ọgbaghaara ruru afọ iri abụọ.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Kpochapụ mpụ na ohi n'Anambra Steeti

Image copyright Facebook/ABS
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Willie Obiano na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar

Aka na-achị Anambra Steeti bụ Willie Obiano adọọla ndị ekperima aka na ntị ka ha gbaara steeti ahụ ọsọ.

Obiano kwuru nke a oge o mepere atụmatụ 'Operation kpochapụ nke abụọ n'ụbọchị Fraịdee.

O kwuru na oge agaala mgbe ndị abalịdịehwu na ndị omekome ji Anambara mere ebe obibi.

Iji mepee ya bụ atụmatụ, Obiano bunyere ndị uweojii ụgbọala dị otu narị na iri n'otu (111).

Ụfọdụ n'ime ụgbọala ndị ahụ bụ nke Innoson Motors mepụtara ebe ụfọdụ si ofesi.

Image copyright Facebook/ABS
Nkenke aha onyonyo Ụgbọala Gọvanọ Obiano bunyere ndị uweojii

Obiano kwukwara na etinyela igwe ose foto Bekee kpọrọ CCTV na mpaghara dị iche iche na Ọnịcha, Ọka nakwa Nnewi.

N'okwu ya, "igwe ose foto ndị na-ahụ ụzọ ruo ihe karịrị ama egwuregwu bọọlụ anọ".

"CCTV ndị ahụ nwekwara ike iseta mmadụ ma n'ime abali."

"Ụgbọala ndị ahụ nwekwara akụrụngwa dị icheiche n'ime ha nke ga-enye aka inwude ndị ekperima n'otu ntabi anya."

Buhari ekeleela onyeisiala mba Ethiopia

Onyeisiala Muhammadu buhari eburula ụkpa ekele bugara onyeisiala mba Ethiopia bụ Abiy Ahmed.

Nke a bụ maka nzere 'Nobel Peace prize' bụ nke e nyere Ahmed n'ụbọchị Fraịdee

Ahmed ritere nzere a n'ihi mkpezi udo o wetara n'etiti mba Ethiopia na Eritrea.

Buhari kwuru na ọ ga-amagbu onwe ya ma mba Afrịka niile bụrụ ndị na-achọ maka udo.

Naịjirịa na P&ID

Image copyright Twitter/@MalamiSan
Nkenke aha onyonyo Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti.

Gọọmentị etiti akwụọla ụlọọrụ P&ID ego dị pound puku narị abụọ na puku iri ise (£250,000) dịka ụlọikpe na London si nye iwu.

Mana onye ọkaiwu nke Naịjirịa bụ Dayo Akpata gwara ndị ntaakụkọ na a ga-akwụghachi Naịjirịa ego ahụ ma ha merie ya bụ ikpe.

Naịjirịa ka na-agba lịkalịka ịtụgharị ikpe ekpebiri na London n'oge gara aga nke na-ekwu ka ha kwụọ ụlọọrụ P&ID ijeri dọla itoolu na ụma isii n'ihi nnupu isi na nkwekọrịta ha nwere n'afọ 2010.

Na Liberia

Image copyright AFP/GETTY
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Liberia bú George Weah

Ndị uweojii mba Liberia emechiela ụlọọrụ ntaakụkọ redio a kpọrọ roots FM n'ike n'ihi ebubo na ha enweghị akwụkwọ ikike.

Ndị nwe ụlọọrụ ahụ kwuru na ha nwere akwụkwọ ikike kama na mmechi ahụ bụ maka na ha na-akatọ ọchịchị aka ike onyeisiala George Weah.

Belgium alaferela

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Lukaku enyela goolu anọ n'asọmpi atọ ọ gbaara ndị Beljum

Mba Belgium ji ọkpụ goolu itoolu wee supee SanMarino n'asọmpi ha gbara ụnyaahụ iji bụrụ ndị mbụ tozuru oke isonye na egwuregwu Euro 2020.

Romelu Lukaku nyere goolu abụọ n'asọmpi ahụ, ebe ndị ọzọ dịka Christian Benteke nakwa Nacer Chadli nyekwara goolu.

Ịngland na Check Repọblik ga-ezute n'abali taa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: