Ofala festival: Taa ka Igwe Achebe pụtara n'ebube ya gbaa egwu Ọfala

Obi nke Onitsha, Nnaemeka Alfred Achebe (Agbogidi) Image copyright Twitter/Ofala Onitsha
Nkenke aha onyonyo Obi nke Onitsha, Nnaemeka Alfred Achebe (Agbogidi)

Taa ka emume Ọfala nke iri na asaa nke Obi Ọnịcha bụ Alfred Achebe malitere n'uju.

Ọfala bụ nnukwu emume n'ala Igbo, tụmadị n'Anambra.

Ọ bụ emume nke eze obodo ji egosi ndị ọ na-achị onwe ya kwa afọ.

Ndị obodo na-ejikwa emume a ekwuputa nkwenye ha na irube isi ha nye eze ha.

Eze ndị obodo dị ịche n'Anambre steeti na-agba ọfala, mana ọbụ nke ndị Ọnịcha kacha ada ụda.

Onye bụ Nnaemeka Achebe?

Igwe Nnaemeka Achebe bụ Obi nke iri abụọ n'otu nke Ọnịcha.

E chiri ya Obi nke Ọnicha n'ọnwa May 2002.

Aha otutu ya gunyere Agbogidi, Enyi, Agu, Ọkara mmadụ ọkara mmụọ, Mkpu, wee dịrị gaba.

A mụrụ Achebe n'onwa May afọ 1941.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Columbia nke dị na New York na mba Amerịka.

Mgbe ọ lọghachiri Naịjirịa n'afọ 1972, ọ malitere ọrụ n'ụlọọrụ na-emepụta Mmanụ Agbidi bụ Shell Petroleum Company.

Achebe rụgidere na Shell ruo mgbe ọ lara ezumike nka n'afọ 1995.

Mgbe ọ nọ na Shell, ọ rụrụ ọrụ dịka otu n'ime ndị isi ụlọọrụ ahụ na mba Angola, Ghana, UK, Liberia, Netherlands, Nigeria, Sierra Leone, nakwa The Gambia.

Kedu mgbe Ọfala malitere?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo James Okosi II, Obi nke Onitsha n'afọ 1956, mgbe ọ gara ịnabata Ezenwanyị mba UK bụ Elizabeth nke abụọ.

Ọ bụ mkpụrụokwu abụọ: ọfọ na ala, ka e ji mepụta okwu a bụ ọfala.

Nke a gosipụtara na ọbụ eze obodo ji ọfọ nke obodo ahụ.

Akụkọ kọrọ na Ọfala malitere mgbe gboo gboo.

N'oge ahụ, ọ bụ naanị ma Igwe na-agba ọfala ka ndị nkịtị n'obodo ji ahụ ya anya.

Mdị mmadụ na-eji oge emume a akwanyere Igwe ugwu pụrụ iche, ebe Igwe na-enyekwa ha ngọzị.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara