Oil Exploration: NNPC ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ugwu Naịjirịa

Ebe a na-amịpụta mmanụ agbidi Image copyright Getty Images

Mpaghara ugwu Naịjirịa esorola na mpaghara na-emepụta mmanụ agbidi.

Ụlọọrụ na-ahụ maka mmepụta mmanụ agbidi na Naịjirịa bụ 'Nigeria National Petroleum Corporation' kwuru na ha ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ahụ.

Ha kọwapụtara nke a n'akwụkwọ ozi nke ha wepụtara na mgbede Fraịde.

Ebe a chọtara mmanụ ahụ bụ na osimiri Kolmani nke dị na Gongola Basin, na mpaghara ọwụwa anyanwụ ugwu nke Bekee kpọrọ 'North East'.

Dịka akwụkwọ ozi ahụ si kwuo, ọbụ n'abalị iri nke ọnwa Ọktoba ka ndị ọrụ NNPC gwupuru ụmị ebe a hụrụ mmanụ agbidi ahụ nakwa ikuku gaasị.

Onye binyere aka n'akwụkwọ ozi ahụ bu Samson Makoji, onye isi ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta NNPC na ndị ọha obodo.

Image copyright NPPC
Nkenke aha onyonyo Mele Kolo Kyari bụ onyeisi ụlọọrụ NNPC

Makoji kwuru na ụmị ahụ ha gwupuru nwekwara nke Bekee kpọrọ 'condesate' na 'light sweet oịl'.

A na-emezi nnyocha ugbua iji chọpụta ole mmanụ dị n'ụmị ahụ ha, ma ọ ga-erukwa nke a ga-ere ere n'ahịa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: