Sexual Offences: Ị wakpo nwaanyị maọbụ ụmụaka, anyị a pịa gị amụ - Ụlọomeiwu Ekiti

Bisi Fayemi
Nkenke aha onyonyo Nwunye Gọvanọ Ekiti steeti bụ Bisi Fayemi so na ndị na-akwado iwu ọhụrụ a

Ụlọomeiwu n'Ekiti steeti na-atule iwu ọhụrụ ha chọrọ iwepụta iji gbochie oke mwakpo ụmụnwaanyị na mmetọ ụmụntakịrị.

Iwu a na-ekwu na onye ọbụla a mara ikpe gbasara mwakpo na mmetọ ụmụnwaanyị, a ga-apị ya amụ.

Iwu a bụ nke a kpọrọ 'Gender-based Violence (Prohibition) Amendment Bill' na Bekee.

Onye bu iwu a n'isi bụ nwunye gọvanọ steeti ahụ bụ Bisi Fayemi

N'okwu ya mgbe a na-atule iwu ahụ n'ụlọomeiwu ndị Ekiti, Oriakụ Fayemi kwuru na iwu a bụ iji chekwaa ụmụnwaanyị.

O kwuru sị: "A kwadoro m iwu a nke ọma. Ọbụ iji chekwaa anyị na ụmụ anyị nakwa ezinụlọ anyị."

"Anyị na-arịọ ụnụ ka ụnụ kwadoo iwu a ma wepụta ya ngwa ngwa."

N'otu aka ahụ, onye ọkaikpe ukwu nke steeti ahụ bụ Wale Fapohunda kwukwara na ya kwadosiri iwu ahụ ike.

Fapohunda kwuru na "mwakpo ụmụnwaanyị na mmetọ ụmụntakịrị na-arịzi ibe ya elu na steeti anyị ugbua."

Gịnị bụ ịpị mmadụ amụ?

Ịpị mmadụ amụ bụ iwepu mkpụrụamụ abụọ nwoke na-enwe.

E mee nke a, nwoke ahụ agaghị enwe ike ịtụnyenwu nwaanyị ime.

Amụ ya agaghị enwe ike ịkwụ ọtọ ọfụma n'ihi na ewepụla ihe na-etiri ya egwu.

Nke ahụ ga-ebelatakwa agụụ inwe mmekọrịta nwoke na nwaanyị.

Mana onye ahụ nwere ike iji amụ ya anyụ maamịrị.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụzọ ọzọ e sikwa apị mmadụ bụ site n'ịgba ọgwụ.

Ọdị ụzọ abụọ e nwere ike iji pịa mmadụ amụ.

Nke mbụ bụ iwepụ mkpụrụamụ, ebe nke abụọ bụ site n'ịgba ọwgụ.

E nwere ike ịgba mmadụ ọgwụ iji kụnwụọ ihe ndị ahụ na-enye aka maka mmekọ nwoke na nwaanyị.

Nke pụtara na onye ahụ agaghịkwa enwe mmasị inwe mmekọ ọzọ.

Ipị amụ ọ ga-eme ka mwakpo kwụsị?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị e boro ebubo ịwakpo nwata gbara afọ iri na anọ na mba Indoneshia n'afọ 2016.

Na mba ụfọdụ n'ụwa, ọ dịkwa ka ịpị amụ enyela aka belata mwakpo na mmetọ ụmụnwaanyị.

Mana ọbụ ịgba ọgwụ ka mba ndị ahụ ji ata ndị dara iwu a ahụhụ.

Mba ndị ahụ gunyere Poland, Mọldova, Indoneshia, Rọshịa, Saụt Koria, nakwa mpaghara ụfọdụ na mba Amerịka.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌka mmụta Boniface Igbenehue