Aisha Buhari abatala n'ike na ebube

Aisha Buhari abatala

Aisha Buhari Image copyright Aisha Buhari Facebook
Nkenke aha onyonyo Nwunye Buhari na-ekwukarị uche ya n'ihe gbasara ọchịchị di ya

Ka gọmenti etiti gbaghachara kepukepu sị na Onyeisiala Buhari chọrọ ịlụ nwaanyị ọzọ, Aisha Buharị abatala n'ike na ebube na njem ọmere na mba UK kemgbe ọnwa abụọ.

Eh, anyị nụkwara na ọṅụ juputara ndị enyi na ikwu na Ibe bụ ndị kweere ya egwu mama anata oyoyo.

Aisha hapụrụ Naịjirịa n'ọnwa Ọgụstụ gawa haji na mba Saụdi Arabịa bụ ebe o si soro dị ya gawa London bụ ebe ọ nọ rụọ ụnyahụ.

Akụkọ na-ekwu na ọ bụ ezumike dọkịnta ya nyere ya mere o ji gawa ya bụ njem.

Ndị zutere ya ka ọ batara na Nnamdi Azikiwe Internationmal Airport bụ nwụnye ndị isiala mbụ na nwụnye ndị gọvanọ ndị ka na-achi ugbua.

Okwuru na ụgbụa ya batara na ahụike, na ya adịla njikere maka ọrụ inyere ụmụaka na ụnwanyị ndị ogbenye aka.

No bra day

Image copyright Getty Images

Ụmụnwaanyị ekwesighị iyi akpa ara pụta n'ụzọ taa.

Taa bụ No Bra day na olu Bekee bụ ụbọchị emepụtara iji tinye uche ụmụnwaanyị maka igbochi ọrịa Cancer.

Ma gị buru n'uche na BRA ahụ pụtara Breast Reconstruction Awareness Day. Ọ bụghị nke akpaara.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a.

Gini ka ụbọchị 'No Bra Day' pụtara?

Egbuola onyeisiojii ọzọ na Texas

Image copyright Facebook
Nkenke aha onyonyo Atatiana Jefferson

N'ofesi, ndị uweojii agbagbuola Atatiana Jefferson na Texas.

Ndị uweojii akpọrọ ka ha bịa mata mkpọtụ na-eme n'ụzọ be ha sị na ha chere na nwaagbọghọ ahụ dị afọ iri abụọ na asatọ chọrọ ịgba ha egbe.

Onye agbata obi nwa ahụ egburu sị na ya nụru mkpọtụ na-eme na ụzọ nwaagbọghọ ahụ nke mere o ji kpọọ ndị uweojii.

Ndị uweojii sị na mgbe ha na-agagharị na-enyo anya na ugegbe mpio mkpuru ebe nwa ahụ nọ, na ha hụru onye na abịa nso nọ n'ime ụlọ ahụ were chere na ọnye ahụ bịa ịwakpo ha were gbakanyere ya egbe.

Mana ọkaikpe nwaagbọghọ ahụ na-ekwu na ọ na agba okwe na TV n'ime mkpuru ha mgbe ọ nụrụ mkpọtụ ndị ụweojii ahụ gazịa nyoo ka ọ mata ndị nọ ebe ahụ.

Naịjirịa na Brazil apịala nku

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Renan Lodi na Alex Iwobi na-achipụ ya na asọmpi enye na enyi nke Naijirịa na Brazil gbara ụbọchị Sọnde na Singapọ

N'egwurewgwu, Naịjiria na Brazil agbaala onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ n'asọmmpi enye na enyi ha gbara taa na Singapore.

Joe Aribo nyere ndị Naịjirịa goolu ha na nkeji 35" ebe Casemiro saara Brazil ya bụ goolu na nkeji 48", ka alatachara ezumike.

Chi Super Eagles zọọrọ ha ka odogwu Real Madrid a bụ Casemero chọrọ itinye goolu nke abụọ ya na goolu mana ya bụ anụ gbanahuru ya ma okwoghị ya nke bụ ọdụ.

Ọkpa nkọ Brazil ji eje mba so sọọ ya bụ mpi bụ mmadụ dịka Philipe Coutinho, Gabriel Jesus, Roberto Firmino nakwa ochie dika dịka Dani Alves.

Mana ndị a niile achịtaghị aja n'ihu Super Eagles maka na ha ji nku ha pịanye ha ajụ n'anya.

Cheta na Brazil ji ọkpụ atọ asataghị otu pịajie Super Eagles nku mgbe ha gbara bọolụ nke ikpeazu na National Stadium, Abuja.

Asọmmpi enyi na enya a agbara ka onye nkuzi Super Eagles bụ Gernot Rohr sị na ọ bụ ya ka ya ji akwado maka asọmmpi iko mba Afịka na-abịanụ.

N'ụlọ ọrụ nnọchite anya mba Brazil dị na Legọs, ndị nkwado Super Eagles buru egwu na ịgba ga ikiri ya bụ bọolụ ebe ahụ.

Ndị ọrụ BBC sochiri ha azụazụ ebe ahụ ịwetere unu ka o sị gaa.

Nkenke aha onyonyo Ndị nkwado egwu bọolụ Super Eagles na embasi ndị Brazil
Nkenke aha onyonyo Ndị nkwado egwu bọolụ Super Eagles na embasi ndị Brazil

Gee akụkọ ndị aniile n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị