Otu nwoke adaalụ nwụọ na ọdọugbọelu dị na Legọs ka ọ nụrụ na nwunye ya nwuru

Murtala Mohammed Airport Lagos Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Murtala Mohammed Airport Lagos

Arụ mere ụnyahụ bụ Satọde ka otu nwoke onye Naịjirịa na-eme njem na mba France dara nwụọ mgbe ọ natara ozi na nwunye ya nwuru.

Nwaamdị a akwụọla na ahịrị ịbanye ụgbọelu oji efepu mba ofesi mgbe ọ nwetere ozi a.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na MMIA bụ DSP Joseph Alabi gwara BBC na ngwa ngwa ya bụ nwoke dara n'ala ka ha buru ya gawa ụlọọgwụ mana ọ mechere nwụọ n'ebe ahụ ụnyahụ.

Alabi sị na ya bụ ọdachi a mere ihe dịka elekere ise nke mgbede bụ mgbe e jiri buru ya ozigbo gawa ụlọogwu dị na Ọdọugbọelu ahụ bụ ebe dọkịnta Bekee nọ ebe ahụ bụ Ajayi Olamide kwuru na ya bụ nwaamdị ekubiela.

Ozu nwaamadị ahụ amatabeghị aha ya nọ n'ọbaozu dị na Air Force Hospital ugbua.

Akụkọ ga-amasị gị