Boko Haram Insurgence: Anyị ga-ewe dinta 10,000 n'ọrụ ibibi Boko Haram - Gọvanọ Borno steeti

Dinta Image copyright Getty Images

Gọọmentị Borno steeti na-achọ iwe ndị na-achụ nta n'ọrụ iji buso ndị Boko Haram agha na steeti ahụ.

Gọvanọ Babagana Zulum chọrọ dinta puku iri (10,000) n'atụmatụ ọ sị ga-enye aka ibibi ndị Boko Haram.

Zulum kwuru na o nwetala ihe ruru mmadụ puku abụọ si na mpaghara Ugwu Naịjirịa, bụ ndị dinta ga-enyere ndị agha aka ịluso ndị Boko Haram ọgụ.

Isa Gusau bụ otu n'ime ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ Zulum, gwara BBC Newsday sị "Dinta ndị a si na mpaghara dị iche iche n'ugwu. Ihe gbasara oke ọhịa dị iche iche doro ha anya nke ọma.

"Gọvanọ Zulum na-eche na ọ ga-aka mma itikọta atụmatụ dị iche iche iji alụ agha a. Ndị dinta a ga-enyere aka n'igosi ụzọ".

Cheta na agha Boko Haram a malitere kemgbe afọ 2009 ataala isi ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ.

Amnesty International ebola ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ebubo mmegbu ọzọ

Nkenke aha onyonyo Ndị ngalaba ikike diiri onwe dịka ha na-ebido "Freedom of Expression Brief"

Ngalaba na-ahụ maka ikike dịirị onye bụ Amnesty International, ekwuola na mwakpo na ịcha ọkụ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-acha ndị ntaakụkọ ejirila otu ụkwụ karịa ibe ya.

Ha kwuru sị na ọ kacha njọ ebe ndị na-anaghị atụ ụjọ ịkatọ gọọmentị nọ, nke mere na a nwụchiela ihe ruru ndị ntaakụkọ iri na itoolu kemgbe mbido afọ a.

Mana ndị ọrụ nchekwa agọrọla ụkwụ na aka ha kwa mgbe gbasara nke a.

Gụọ maka ya n'uju ebe a: Ndị nchekwa ejichiela ndị ntaakụkọ 19 n'afo a

Sịnịgal emeriela WAFU

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Youssouph Badji nyeere Sịnịgal goolu n'egwuregwu ikpeazụ ha ji bulie iko a

Sịnịgal meriri Gana iji maburu iko asọmpi Wafu bụ asọmpi ndị mba si mpaghara west afrịka, nke afọ 2019.

Otu abụọ a gbaburu onye laba onye laba ka ha abụọ nyere otu goolu n'ime nkeji 90 tupu ọ banye na penariti nke 'gbaa ka anyị laa'.

Naịjirịa bịakwara asọmpi a, mana obodo Cape Verde mere ha Aaron gba aka ka ha ji penariti gbapụ ha n'agba anọ nke ikpeazụ.

'#NoPantDay' na-ewu

Gịnị bụ nke a?

N'ụbọchị 13 nke ọnwa Ọktoba 2019, e mere "#NoBraDay" iji kwuputa maka ọrịa akpụ nke ara.

Mana ugbua, ndị mmadụ na-ekwuzi ka ụmụnwaanyị ghara iyi drọs n'ụbọchị 14.

Lee ụfọdụ ihe ha kwuru:

__mrjoe jụrụ kedụ ọrịa akpụ nke kpatara a ga-eji ghara iyi ọbante?

Malaysia amaala ụmụ Naịjirịa 119 ikpe ọnwụ - Amnesty International

Image copyright Getty Images

Ụmụ Naịjirịa dị mmadụ otu narị na iri na itoolu (119) ka a marala ikpe ọnwụ na mba Malaysia maka ibu ọgwụ ike.

Nke a bụ dịka otu 'Amnesty International' si depụta n'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Mọnde.

AI bụ otu a ma ama n'ụwa ọrụ ha bụ iwulite ikike dịịrị onye.

Ha kwuru na mmadụ dị otu puku, narị abụọ na iri asatọ na otu (1,281) bụ ndị a mara ikpe ọnwụ na Malaysia n'ọnwa Febrụwarị 2019.

N'ime ndị a, narị ise na iri isii na asatọ abụghị ndị Malaysia.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌgwụ ike Enugwu

AI kwuru na ihe dị otu a adịghị mma.

Otu ahụ chọrọ ka a kwụsị ịma mmadụ ikpe ọnwụ na Malaysia nakwa na mba niile nke ụwa.

Abụbụ ọrụ ndị NLC

Image copyright AFP

Otu jikọtara ndị ọrụ bekee bụ Nigerian Labour Congress agwala ndị otu ya ka ha jikere ịgba abụbụọrụ n'ụbọchị iri na isii ọnwa Ọktoba.

Ha sị nke a ga-eme maọbụrụ na gọọmetị emeghi ihe ha chọrọ banyere ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ.

Mkparịta ụka mbụ ha na gọọmentị nwere mara afọ n'ala nke mere e ji yigharịa ọzọ na Tuzde 15 Ọktoba, 2019.

Ndị otu a na-achọ ka e tinyere ha pesentị iri abụọ na itoolu n'ego a na-akwụ ndị ọrụ nọ n'ogogo asaa ruo ogogo iri na anọ.

Ebe a ga-etinye pesentị iri abụọ na anọ na nke ndị ọrụ n'ogogo iri na ise ruo ogogo iri na asaa.

Mana onyeisi otu jikọtara ndị gọvanọ bụ Kayode Fayemi ekwuola na ndị gọvanọ agaghị akwụli ụdị ego ahụ.

A hụla ụmụaka itoolu a tọrọ na Kano n'Ọnicha

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme

Ndị uweojii Kano Steeti ekwuola na ha azọpụtala ụmụaka itoolu a tọọrọ na Steeti ahụ dịka akpọ ha gaa Ọnịcha dị n'Anambra Steeti.

Kọmishọna uweojii na Steeti ahụ bụ Ahmed Iliyasu gwara ndị ntaakụkọ na ha kpachiri mmadụ asatọ a na-enyo na aka ha dị n'ịtọrọ ụmuaka ndị a.

N'ofesi

Image copyright Getty Images

Ihe karịrị mmadụ puku narị etinyela aka n'ịchọ nakwa ịzọpụta ndị mmadụ tọrọ n'ihi oke ifufe na mmiri ozuzo metụtara na Japan na Satọde.

Oke mmiri ozuzo a a kpọrọ Typhoon Hagibis bụ nke kacha ọjọọ na metụta Japan n'ime ọtụtụ afọ.

N'egwuregwu

Onye nchịkọta otu egwu bọọlụ ndị Bulgaria bụ Krasimir Balakov ebola mba Ingland ebuboi ịkpaoke agbụrụ ebe ọ dị ukwuu.

Nke a na-abịa dịka Bulgaria ga-ele Ingland ọbịa taa n'asọmpi itozuoke nke Euro 2020.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKing Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12