Border Closure: 'Enweghị ibu ga-esi n'oke ala Naijirịa gafee maọbụ bata' - Hameed Ali

Hameed Ali Image copyright FACEBOOK/NIGERIA CUSTOMS SERVICE
Nkenke aha onyonyo Onyeisi ngalaba nchekwa oke ala, Hameed Ali

Ngalaba gọọmentị a kpọrọ "Ex-Swift Response" nke mejuputara ngalaba na-ahụ maka nchekwa oke ala bụ (Nigeria Customs Service) na ndị na-ahụ maka nkwabata na nkwapụ (Nigeria Immigration Service, ekwuola na ha agaghị agbape oke Naijirịa tupu ndị mba ha na Naijirịa gbara oke emee ka ha sị kwekọrịta.

Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa oke (Customs) bụ Hameed Ali kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ zutere.

Ali kwuru na naanị ihe ha chọrọ bụ ka mba ndị a bido ime ihe ha na Naijirịa kwekọrịtara maka ngafe ibu mgbe Olusegun Obasanjo bụ onyeisiala.

O kwuru na mgbachi oke ala Naijirịa eritela erere ihe ruru otu ijeri naira na ọma anọ (1.4 billion) sitere na mmachi osikapa na ahịa iwu ndị ọzọ.

Hameed Ali kọwakwara na mba Nijee ebidola ime ka ha siri kwekorịta site n'ịmachi ibubata osikapa na Naijirịa.

Nkenke aha onyonyo Ndị nchekwa ogige nke 'Ex-Swift Response'

N'aka nke ọzọ, onyeisi ngalaba na-ahụ maka nkwabata na nkwapụ bụ Muhammed Babandede kwukwara na ha anwụchiela ụfọdụ ndị mmadụ n'oke ala Naijirịa.

O kwukwara na onye na-enweghị akwụkwọ njem agaghị agafe oke Naijirịa.

Babandede kwuru na ha gbochiri ndị Naijirịa otu nari na iri ise (150) ịhapụ Naijiria makana akwụkwọ ha ezighị ezi, gbochie ndị mmadụ otu puku na otu narị na iri na ọtụ (1,111) ịbata maka akwụkwọ ezighi ezi.

O kwukwara na ha ejidela ma chụghachị mmadụ narị asaa na iri abụo na asatọ (728) makana ha enweghi akwụkwọ ziri ezi ma nọrọ na Naijiria.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha nwụchikwara ndị Pakistan na Nọt Koriya na-esighi n'oke ECOWAS, chụghachị ha ma machie ha ịbata Naijiria ebighebi.

Akụko ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKing Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12

Isiokwu Ndị Emetụtara