Rivers Flooding: 'Idemmiri achụbatala agwọ n'ime ụlọ anyị'

Ide Mmiri Image copyright Odogu Emman

Ndị mmadụ bi n'ụfọdụ ebe na Rivas steeti etiela mkpụ rịo ka gọọmentị were ọsọ were ije bịa nyere ha aka dịka idemmiri na-enye ha ọsọ n'obodo ha.

Ọtụtu ndị bi na Rumuokwurushi akwapụla maka mkpamkpa idemmiri na-akpa ebe ahụ.

Ka ọ dị ụgbua, ha na-eji ụgbọmmiri abata ma na-apụ n'ụlọ ha.

Nkenke aha onyonyo 'Ajọ nsị na ọrịa na-echere anyị aka mgba.' - Favour Ikechukwu

Otu nwaanyị bụ Beatrice Offem, onye ụlọ ya dị n'ogige obibi 'Valley of Decision' gwara onye ntaakụko BBC na kamgbe ọnwa Sepụtemba, na ha na-eji ụgbọmmiri eme njem.

Offem kwuru si "Anyị na-egbu agwọ na anụ ndị ọzọ idemmiri na-ebubata n'ime ụlọ anyị".

Nkenke aha onyonyo ' Kamgbe 2016 ka idemmiri mewere anyị ịwa' - Innocent Dominic

O kwukara sị "Mmiri a na-erute anyị n'obi, ihe anyị chọrọ bụ ezigbo ọwammiri maka na anyị enweghi ọwammiri ebe a".

O kwukwara na ha na-akwụ ndị na-akwọ ụgbọmmiri a otu narị naịra iji bufee ha.

Nkenke aha onyonyo Ndị ji ụgbọmmiri na Rmumuokwurushi.

N'aka nke ọzọ ka ndị bi n'Ahọada, Abua na Ogba Egbema, Ndoni na-ekwu na idemmiri awakpoola ha kamgbe 2017.

Image copyright Odogu Emman
Nkenke aha onyonyo Joy Brown abọọla ihe ọ kụrụ tupu ha eruo oge ha.

Baseme Akio kwuru na idemmiri a na-ebutere ha ọrịa dị iche iche dịka ịba na azụ mgbu.

Lee ihe idemmiri na-eme n'ala Igbo ugbua

O kwukwara sị na ha ahụbeghị enyemaka gọọmentị.

Image copyright Odogu Emman
Nkenke aha onyonyo Ndị bi n'Ahọada na-ekwu na id mmiri na-ebutere ha ọrịa dị iche iche.

Ihe ndị otu gbatagbata NEMA nwere ikwu

Onyeisi ndị otu ọrụ gbatagbata bụ National Emergency Management Authority (NEMA) nke mpaghara Ndịda-Ndịda bụ Ibarakumo Walson, gwara BBC na ha achọpụtala na ọ bụ mmiri ịsọfe oke, enweghị owammiri na oke idemmiri (flash Floods) kacha ebute nsogbu.

Nkenke aha onyonyo "N'oge na-adịghị anya, mmiri nwere ike ilo obodo ndị a" - Ibarakumo Walson

Walson kwuru na ọ bụru na egwughị ala mmiri, ma rụọkwa ọwammiri, na ndị obodo a ga na-ata ahụhụ afọ niile.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionInnoson Motors: Etu m si bido ịgba mbọ

Isiokwu Ndị Emetụtara