Aisha Buhari vs Mamman Daura: Ọ bụ gịnị na-ese okwu n'Aso Rock

Aisha Buhari Image copyright Aisha Buhari Facebook
Nkenke aha onyonyo Nwunye Buhari na-ekwukarị uche ya n'ihe gbasara ọchịchị di ya

O nwere ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi otu nwaanyị nọ n'ime ụlọ na-aba mba ka e mepeere ya ụzọ.

Ọ pụtara mgbe akụkọ asịrị na-ekwu na onyeisiala Buhari chọrọ ịlụ nwaanyị ọzọ maka na nwunye bụ Aisha anọghị ya kamgbe ọnwa atọ.

Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-asị na nwaanyị ahụ bụ Aisha na-eti mkpu mgbe ndị ọrụ onyeisiala jụrụ imepere ya ụzọ.

N'ihi ya Aisha Buhari apụtala gwa ndị ntaakụkọ na ọ bụ ya nọ n'ihe onyonyo ahụ kama na ọ dịla anya ihe ahụ mere.

Ọ sị na ọ bụ nwa nwanne Buhri a na-akpọ Fatima Mamman Daura sere ihe onyonyo a.

Ọ gara n'ihu kwuo na onweghi ihe e mere nwaada a n'ihi na ọ bụ nwa Mamman Daura bụ nwanne nakwa onye ndụmọdụ onyeisiala Buhari.

Fatima Daura kwetara na ọ bụ ya sere ihe onyonyo ahụ mgbe Aisha Buhari chọrọ ịwakpo ha n'Asọ Rock.

Gịnị na-ese okwu?

Nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari sị na Fatima nọ na-achị ya ọchị n'ihe onyonyo ahụ o sere n'ihu ndị ọrụ nchekwa ya.

O kwuru na ọ bụ maka na onyeisiala sịrị ha kwakọrọ pụọ n'ụlọ ha bi ka nwa ya nwoke kwabanye.

Aisha sị na ọ chọrọ ịbanye n'ime ụlọ ahụ mana a gbachiri ụzọ ya agbachi.

Mana Fatima sị na ihe onyonyo a bụ ka o gosi nne na nna ya ụdị agwa Aisha kpasoro ya n'oge ahụ.

Ọ sị na mkpu Aisha nọ na-eti tụrụ ya egwu na ọ hụtụbeghi ihe dị etu ahụ.

Cheta na nke a abụghị mbụ Aisha Buhari na-ekwu okwu banyere mmegbu ọ na-enweta n'Asọ Rock.

N'oge gara aga ọ pụtara n'ihe onyonyo kwuo na o nwere ndị nọ n'Aso Rock 'na-akụrụ onyeisiala Buhari egwu ọ na-agba'.

Akụkọ ga-amasị gị: