World food day: Ụdọdụ nri ndị Igbo anaghị erikawazị

Agbụgbụ na ji

Agbụgbụ maọbụ fịọ fịọ Image copyright Utakaegbe/Instagram
Nkenke aha onyonyo Agbụgbụ maọbụ fịọ fịọ na ji agwọrọ agwọ

Nri a bụ agbugbu ma ọ bụ fịọ fịọ dịka ụfọdụ sị akpọ ya.

Ọ na-adị ka agwa mana ọ bụghị agwa.

Ị gwọ fịọ fịọ na ji, ịtabiri aka.

Ị nwekwara ike itinye ya ụkpaka.

Akụ mkpụ

Image copyright Utakaegbe/instagrm
Nkenke aha onyonyo Akụ mkpụ

Nke a bụ akụ mgbu.

Akụ mgbu bụ ezigbo nrị mgbe gboo.

Akụ na-ada n'udummiri.

N'abali ka ọ na-adakarị.

Lee ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIgbo foods: Ihe mere anyị ji ericha nri tupu anyị ataa anụ

Mmiri zochaa n'abali, ndị mmadụ eburu ọkụ pụọ n'ezi, gbanye mmiri n'ọba.

Dọwa ọkụ n'akụkọ mmịrị ahụ ka ọ na-adọta akụ ahụ.

Ọtụtụ akụ ahụ adanye na mmiri ahụ.

A na-eghe ya eghe n'ọkụ tinye ya nnu.

Ị nwere ike ịta ya otu ahụ maọbụ were ya taa abacha,

Ọ na-atọwa ntị.

Ighu

Image copyright Utakaegbe/Instagram
Nkenke aha onyonyo Ighu

Nke a bụ ighu maọbụ iwu ka ụfọdụ sị akpọ ya.

Ọ dịka abacha mana ọ bụghị abacha.

Ịghụ na-atọchị ntị ma ejiri agbụgbụ maọbụ fịọ fịọ kwọọ ya.

Achichi ede

Image copyright Utakaegbe/Instagram
Nkenke aha onyonyo Achịcha

Achịchị bụ ede eberiri eberi gbaa ya n'anwụ.

Ihe a bụ ụzọ ndị Igbo si echekwa nri maka ụnwụ.

Mgbe ụnwụ ka e ji eri achịcha mgbe gboo.

A na-ejikwa agbụgbụ maọbụ fịọ fịọ agwọ ya tinye ya akwụkwọ ụgbọghịrị.

E nwere ọtụtụ ihe e ji ede esi.

E nwere nke ana akpọ ede mmachu, ya bụ ede agwọrọ agwọ.

Nwekwaa nke bụ ede eko, ya bụ ebe ahụrụ n'ọkụ e ji mmanụ na akpaka eri.

Ọ na-atọchi ntị.

Anyụ

Image copyright Utakaegbe/Instagram
Nkenke aha onyonyo Anyụ

Anyụ bụ ezigbo nrị.

Ọ na-amịkarị n'udummiri.

Ọ na-atọ n'ụbụrụ ma e jiri ji gwọọ ya.

Akịdị

Image copyright Ukataegbu/Instagram
Nkenke aha onyonyo Akidi

Nke a bụ akịdị.

A na e ji ji agwọ ya.

E nwere ike isi ya mgbe ọ dị ndụ.

Nwekwa ike ịchekwa ya n'anwụ maka ụnwụ.

Ero

Image copyright Utakaegbe/Instagram
Nkenke aha onyonyo Ero

Leekwa ero.

Ero na-atọ ụtọ n'ofe.

E nwere ọtụtụ ero dị iche iche .

Ụfọdụ n'ime ha adịghị mma oriri.

Nke a mere na onye amaghị anya ero a naghị akpata ero n'ọhịa.

E nwere ero a na-akpọ ata-achakaanya.

Ọ na-atọ ụtọ, mana ọ na-esi ike n'ọtita.

Ofe ụfọdụ adikabeghịzị

Ofe ụgbọgụrụ

Ofe ụkpọ

Ofe enwegii nnu

Ofe ụtụrụkpa

Ofe ogiri ohi.

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNri ogbenye ọgalanya na-erizi

Akụkọ ga-amasị gị