'Ọgwụ ọbara mgbalielu na-aka arụ ọrụ n'abalị' - Nchọpụta ọhụrụ

Elekere na ọgwụ Image copyright Getty Images

Ndị ma nke ekwe na-akụ ekwuola na ị chọọ ka ọgwụ ọbara mgbalielu gị rụọrọ gị ọrụ ọfụma, ṅụọ ya tupu ị laba ụra abalị.

Dị ka akwụkwọ mgbasaozi European Heart si kwuo, ọ bụ obere ntuziaka nwereike ịzọ ndụ.

Ha kwukwara na nchọpụta ọhụrụ a na-ekwu na ọgwụ a na-aka enye mgbochi maka obi nkoropu nakwa mkpọnwụ ahụ, ma ọ bụrụ na ị ṅụọ ya tupu ị laba ụra n'abalị kama ịṅụ ya n'ụtụtụ.

Ndị ọkachamara kwuru sị na ọnọdụ ime ahụ anyị maọbụ etu ahụ anyị si eme n'ime awa 24 dị n'ime otu ụbọchị na-emetụta etu anyị si anabata ọgwụ.

Wegharịa ọgwụ ka ya na ahụ gị na-arụkọ

E nwere ihe mgbaama dị ugbua na-egosi na ọgwụ dị iche iche, gụnyere ọgwụ maka obi, nwereike ịrụ ọrụ ọfụma ma ọ bụrụ na ị ṅụọ ya n'otu mgbe n'ụbọchị.

N'ime nchọpụta nke ugbua, e ji ihe ruru mmadụ puku 19 wee nwalee ọgwụ ọbara mgbalielu ahụ.

Na nwale nke e mere ndị si mba Spen:

  • E kewapụtara ndị e nyochara ụzọ abụọ - otu bụ ndị ṅụrụ ọgwụ n'ụtụtụ ebe ndị ọzọ bụ ndị ṅụrụ ya tupu ha alaba ụra abalị.
  • Ndị ọkachamara gbadoro anya ihe karịrị afọ ise ịmata ihe ga-eme ndị ahụ ha na-enyocha.
  • Ndị ṅụrụ ọgwụ ahụ n'abalị budatara ohere isi n'obi nkoropu maọbụ mkpọnwụ ahụ anwụ, budaruo ya ọkara.
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Komkom e ji etinye ọgwụ na-enyere ndị mmadụ aka ịma mgbe ha ga-aṅụ ọgwụ na ọgwụ ole ha kwesịrị ịṅụ

Ọbara mgbalielu kwesịrị ịgbada n'abalị, dịka anyị na-arahụ ụra ma na-ezu ike.

Ndị ọkachamara sị na ọ bụrụ na ọ daghị n'abalị, na-arị elu oge ọbụla, mgbe ahụ ka ị nwereike ibanye na nsogbu obi nkoropu nakwa mkpọnwụ ahụ.

Dịka nchọpụta ahụ si kọwaa, ịnwụ ọgwụ gị n'abalị ga-enye aka ibudata nrugharị ọbara gị n'abalị, maka ndị a chọtara ya bụ ọrịa nke Bekee kpọrọ Hypertension n'ahụ ha.

Ndị nke ṅụrụ ọgwụ ha tupu ha alaba ụra, nrugharị ọbara ha n'abalị nakwa n'ime ụbọchị dị ọkara, ọ gbadakwa ọzọ n'abalị, ebe ndị nke ṅụrụ nke ha n'ụtụtụ adịghị etu ahụ.

Ọkammụta Ramon Hermida nke mahadum Vigo bu nchọpụta a n'isi, sị na ndị dọkịta nwereike itule ya ma gwa ndị ha na-agwọ ọrịa maka ya, n'ihi na o nwere ike ịzọ ndụ ọtụtụ ndị mmadụ.

Image copyright Getty Images

Atụmatụ e ji agwọ ọbara mgbalielu ugbua enweghi oge e dere na ọ bụ mgbe ahụ ka a ga-eji agwọ ya. Ndị dọkịta na-akacha agwa ọtụtụ ndị mmadụ ṅụọ ọgwụ n'ụtụtụ makana nkwenye na-ekwu na ọ na-akụda nrugharị ọbara n'ụtụtụ.

"Mpụtara nyocha a gosiri na ndị na-aṅụ ọgwụ ọbara mgbalielu tupu ha alaba karịa ịṅụ ya mgbe ha tetara, na-enwe ike ijide nrugharị ọbara ha. Nke ka mkpa bụ na ọ ga-ebudata ohere ha inweta ọrịa obi nakwa nke ọbara nakwa ọnwụ."

O kwuru na ha ka kwesịrị ime nyocha ndị ọzọ si n'ọgbakọ ndị mmadụ si mpaghara ọzọ ịmata ma nchọpụta ha ọ ga-abara onye ọbụla nakwa ọgwụ ọbara mgbalielu dị iche iche.

Gbaara ụdịrị omume a ọsọ makana o nwereike ịmetụta nrugharị ọbara gị:

  • Ịṅụ oke mmanya na-aba n'anya
  • Ịfụ anwụrụ
  • Ibu oke ibu
  • Agbatịghị ahụ etu e kwesịrị
  • Iri oke nnu

Vanessa Smith, nke si na British Heart Foundation, kwuru sị: "N'agbanyeghị na nchọpụta a kwadoro ihe a chọpụtaburula n'ihe gbasara ọrịa a, a ka kwesịrị imekwu nyocha n'ebe ndị mmadụ si agbụrụ dị iche iche nọ, nakwa ndị na-arụ ọrụ ịgbanwe oge (shift), iji chọpụta ma n'eziokwu n'eziokwu ịnwụ ọgwụ nrugharị ọbara n'abalị ọ na-aka mma maka ahụike obi."

"Ọ bụrụ na ị na-aṅụ ọgwụ ọbara mgbalielu ugbua, ọ dị mkpa ịjụ dọkịta gị tupu ị gbanwee oge i ji aṅụ ya. Makana e nwereike inwe ihe kpatara dọkịta ji sị gị na-aṅụ ya n'ụtụtụ maọbụ n'abalị."

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe nwaanyi na-arụ ọrụ ma nọdụ n'ọmụgwọ na-agabiga