Enugu state Fire Service: Ụdị ọkụ gbara n'Onitsha agaghị eme n'Enugu makana anyị dị njikere

Ụgbọala mgbanyụ ọkụ n'Enugwu steeti

Ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ n'Enugwu steeti ekwuola na ha dị njikere ịgbanyụ ụdịrị ọkụ ọbụla n'ihi na akụrụngwa ha ji arụ ọrụ zuru oke.

Onye isi ụlọọrụ steeti ahụ bụ Okwudili Ohha, gwara BBC Igbo na ụlọọrụ ha nwere nnukwu ụgbọala mgbanyụ ọkụ iri na abụọ na tanker abụọ na-ebu mmiri, nke mmiri juru n'ime ha chere echere oge ọbụla.

Ohha kwuru na udịrị ọdachị ọkụ ọgbụgba mmanụ ụgbọala mere n'Ọnịcha apụghị ime n'Enugwu n'ihi na ha kere nkwụcha oge niile.

Image copyright Engr Okwudili Ohha
Nkenke aha onyonyo Ohha kọwara na ha nwekwara tanka na-enyere aka ma mmiri gwụwa.

Iji zaa ajụjụ maka ụgbọala tanka bụ mmanụ mebiri na New Artisan n'Enugwu abalị abụọ gara aga, ọ kọwara na ngwa ngwa ya bụ ihe mere, ụlọọrụ ya jiri kemikalụ wee kwụsị ya bụ mmanụ na-awụsasị n'ala ịghọrọ ọkụ.

Dịka Ohha kwuru, ọ karịala ugboro isii ụgbọala bu mmanụ ụgbọala nwere nsogbu n'Enugwu n'ime otu afọ, mana onweghị nke ghọrọ ọkụ n'ihi nkwụcha ụlọọrụ ha kere n'Enugwu.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnitsha fire: "Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?

Isiokwu Ndị Emetụtara