Anambra state budget: Ha ga-emefu N137.1b n'afọ 2020

Willie Obiano Image copyright Governor Obiano/Facebook
Nkenke aha onyonyo Obiano kwụnyere Rita Maduagwu

Nke si Anambara steeti eru anyị ntị bụ na ụlọomeiwu ha ebinyela aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2020.

Ha na-atụ anya na a ga-emefu ijeri otu narị na iri atọ na asaa na ụma.

Tanka ọzọ bu mmanụ ụgbọala adaala n'Enugu state

Nnukwu ọdachi gaara ata isi ọtụtụ mmadụ bụ nke e gbochiri n'ụtụtụ taa oge tanka bu mmanụ ụgbọala dara ma wụsachaa ihe o bu n'ebe ụzọ adịghị mma n'Ọnyeama dị n'Enugwu.

Ebe o si dị mma bụ na ngwa ngwa ya bụ ihe mere, ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ n'Enugwu steeti jiri akụrụngwa Kemịkal eji egbochi ọkụ wụsasịa n'elu ya bụ mmanụ ụgbọala na-awufu nke mere na ọkụ amaliteghị gbawa.

Gụọ ya n'uju ebe a: Tanka ọzọ bu mmanụ ụgbọala adaala n'Enugwu steeti

Onye agha egbuola ndị otu ya

Arụ mere dị ka otu onye agha tụtụrụ egbe gbagbuo ndị otu ya asatọ ma merụọ abụọ ọzọ ahụ na mba Rọshịa.

A mabeghi ihe kpatara, mana a na-ekwu na ọ dị ka isi ezuchaghị ya oke.

N'egwuregwu,

Nwaafọ Igbo bụ Wilfred Ndidi na ndị otu ya bụ Leicester city ga-ezute Southampton na Premier League.

Amụmammiri egbuola ehi asatọ ọzọ n'Ondo steeti

Egbeigwe agbagbuola ehi asatọ ọzọ n'ugwu Oyinmo Quarter, Ikare Akoko, nke dị n'okpuruọchịchị Akoko Nọt n'Ondo Steeti.

Image copyright Getty Images

Femi Joseph bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ sị na nchọpụta amalitela ka amara ebe mmiri sị baa opi ụgbọghụrụ.

Mana onyeisi ndị Myetti Allah steeti ahụ bụ Garuba Bello sị na ya bụ okwu erubeghị ya na ntị.

Nke a na-eme ha ehi iri atọ na isii (36) nwụburu na okpuruọchịchị Ifedore nke steeti ahụ ọnwa gara aga.

BBC nụrụ na ndị ọchịehi nwe ya bụ ehi ndị nwụru mere ngwa ngwa resi ya ndị na-egbu anụ n'obodo ahụ, dịka onye Femi Joseph sị kwuo.

Ọ sị na aka ndị uweojii akparalarị ndị ogbuanụ mmadụ anọ na otu onye ọchị ihe mere ihe ahụ.

NLC akwadowala maka ụgwọ opekatampe

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Otu NLC bụ otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị ọrụ

Otu ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress ekwuola na ndị otu ha nọ na steeti dị iche iche ga-enwete ntụzịaka ha na gọọmenti steeti ha ga-esi nwee nkwekọrịta ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe.

Amaechi Asuguni bụ onye nọchite anya onyeisi otu a gbara ama a mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ọgbakọ ha nwere n'Enugwu ụnyahụ.

Nke a na-eme ka gọọmentị na ndị otu ọrụ a kpebiri maka ụgwọọnwa ahụ tọzde gara aga n'Abuja.

Ọ gachaala abalị 182 gọọmenti etiti tinyere aka maka ya bụ ụgwọ opekatampe tupu e nwee ya bụ mgbebi. bụ ebe ha nọ kwete iji pasenti 23.2 bulie ụgwọọnwa ndị nọ n'ogogo nke asaa, jiri pasenti iri na abụọ bulie nke ndị nọ n'ogogo nke asatọ.

A ga-eji pasenti 19 bugo ụgwọọnwa ndị ọrụ nọ n'ogogo nke itoolu ebe pasent iri na isii ga-eruwe ndị nọ n'ogogo nke 10 na 14.

Ọgbakọ ndị gọvanọ ekwuola na ihe ruru steeti iri abụọ dị njikere ịkwụ ya bụ ụgwọọnwa ohuru.

Mana Asuguni ekwuola ka ndị otu ha nọ na steeti ghara ịkụ mgbanụ na steeti ha ịnwe nkwekọrịta maka na ndị otu ha ga-ezitere ha ntuziaka ga-enyere ha aka ha na gọmenti ịkwekọrịta.

EU na-eche maka ịgbatị oge UK

Image copyright AFP/Getty Images

N'ofesi, European Union na-eche ịnwe nzụkọ maka ịnyekwu Briten nwaoge ka ha nwee ike ịkpebi mgbe ha ga apụ na EU.

Nke a na-eme dịka ndị omeiwu Briten kwekọrịtara ịme ntuliaka n'ọnwa Disemba.

Ọtụtụ ndị omeiwu EU na-eche na ọ ga-adị mma inyekwu Briten ọnwa atọ ka ha were chịkọnata onwe ha maọbụ gbubie ya bụ oge ma ha mee ngwangwa.

Mana France chọrọ ka enye ha nkenke oge site na Desimba 31 bụ mgbe e tinyeburu ya.

Pepe agbarala isi onwe ya n'Arsenal

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, ama na unu anụla nke kpọtụrụ n'abalị ụnyahụ dịka nwaamadị akpụnaọnụ bụ Nicolas Pepe sị zọpụta Arsenal na ndagwurugwu nke ọnwụ.

Pepe nyetere Arsenal goolu abụọ n'ime atọ ha jiri merie Vitoria Guimaraes bụ ndị satara abụọ n'ime ha.

Akpụ Pepe n'ọnụ maka na ọ meghị nke ọma na asọmpị nke gara aga, mana ugbua, ọzọrola isi onwe ya.

Gee akukọ anyị n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara