Business in Nigeria index: Ịchụntaego na Naịjriịa ewerela nkatụ 15 rigo - World Bank

Ịzụ ahịa na Naịjirịa Image copyright Getty Images

Ụlọakụ mbaụwa bụ World Bank ebuliela Naịjirịa n'ogogo n'ihe gbasara ịchụntaego.

Naịjirịa bụ ndị na-agbabu ndị nke 146 n'afọ 2018, nọzị 131 ugbua dịka onyeisiala Muhammadu Buhari dere n'akara Twitter ya n'ụbọchị 24 nke ọnwa Ọktoba 2019.

Nke bụ na Naịjrịa agafeela mba iri na ise n'ọsọ usoro ịchụntaego.

N'agbanyeghị, ndị na-achụ ntaego na mba ahụ sị na ọ bụghị ihe ya bụ akị ilu na-ada n'ọnụ ka ọ na-atọ n'ụtọ.

Ihe a bụ ogoogo ụlọakụ mbaụwa na-ahazi n'ime mba 190 ha ji amata ọkaibe kwa afọ.

Image copyright Science Photo Library

Ọnụ na-ekwuru ndị na-agba ahịa na Naịjirịa bụ Austin Nwosu, kwuru na n'ezie ahụhụ belatara n'ịgba ahịa ofesi.

Ọ sị na kemgbe e hibechara ya bụ atụmatụ ha kpọrọ "ease of doing business", na ahụhụ belatara nke bụ na mmadụ nwereike ibu ahịa ya si mba ofesi n'abalị abụọ.

Nwosu sị na "e wepụrụ ụfọdụ ndịọrụ na-enwocha ibu na wọọfụ, bụ ndị na-adọghachị ọrụ azụ".

Ọ sị na ihe fọrọ ugbua bụ ime ka ndịọrụ niile so n'otu nwee oghere ị na-eji kọmputa, nke ga-eme ka ndịọrụ niile nweeike ịrụ ọrụ ha n'otu oghere ahụ.

Ọ sị na ha etiela mkpu ya tigara ndị ọnụ na-eru n'okwu mana ha anụbeghị.

Nwosu sịkwa na ajọ ụzọ sokwa na-adọghachi ọrụ azụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border''

Isiokwu Ndị Emetụtara