Butt Implant: 'Achọrọ m ịwepụ otele m gotere egote'

Ike e tinyere etinye Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị abụo ndị mba Ịngland nwụrụ mgbe ha gara ka a waa ha ike na mba Tọki

Sophie Elise bụ nwaagbọghọ dị afọ iri abụọ na anọ nwere agba n'ihe onyonyo na Norway ma nwee ndị nkwado puku narị ise n'elu 'Instagram'.

Sophie kọwara na o nwere obere ahụ mana ọ chọro ka e wulite ukwu ya ka ọ dị ka nke 'nwaanyị Owere'.

Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-agbasa iwulite otele dị ka ngwaahịa n'Instagram, Sophie graa mba Tọki ịzụta otele nke ya.

O kwuru na ọ na-atụ anya na ọ ga-ada ezigbote ọnụ, mana ha beere ya ezigbo ego nke mere ka obi dị ya mma.

Image copyright SOPHIE ELISE
Nkenke aha onyonyo O rụola afọ ise Sophie tinyere otele ukwu ọhụrụ

"O bere ego oo, o bere ego karịa ihe ọ kwesịrị ibụ" ka Sophie gwara ndị mgbasa ozi 'Radio 1 Newsbeat'

Gịnị mere ọ ji chọọ ịwepụ ya ugbua?

O kwuru na mgbe a wachara ya otele, na ahụ fụrụ ya ụfụ.

Mgbe na-adịghị anya, ndị mmadụ na Soshal Midịa bidoro kwuwe okwu maka otele ya.

Ndị mmadụ kwuru na otele ọhụrụ ahụ na ahụ ya agakọghị nke ọma.

"Ugbua ka m matara na ọ bụghị ihe m kwesịrị ime. Ihe niile mere m 'vuum' n'anya, ugbua ka m matara na m echeghị ya ọfụma tupu m waa otele m" ka Sophie kwuru.

Sophie tinyere nke a na-etinye etinye akpọro 'Silicone' mana e nwere atụmatụ ọzọ ebe a ga-ewere abụba dị n'ahụ mmadụ were tinye n'otele ka o buo ibu.

Ọ chọpụtala na ahụ ya mara mma ma ghọta na onweghị ihe o ji.

Mana ịwepụ otele ya ugbua nwere 'Kọma'

Sophie mechazịrị chọta onye dọkita na-awa ahụ nke ọma.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNkechi Blessing sunday: Otele ukwu m na-ekopu ụwa

Dọkita a kọwaara ya na o nweghị ike ịwepụcha ha niile n'ihi na nke e tinyeere ya bụ nke a na-etinye n'ara.

Ọ gwara Sophie na ihe ga-emebi ma e wepụchaa ha niile n'ike.

Sophie kwuru na ọ ga-arụzi otele ya n'ọdịnihu, mana ka ọ dị ugbua, ọ ga-ewelata ya ka ọ dịkwa ka ihe yiri anụ ahụ mmadụ.

Akụkọ ga-amasị g:

Ihe nkịrị ga-amasị g:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'

Isiokwu Ndị Emetụtara