Border Closure: Nweenụ ndidi, ihe dị ọkụ ga-ajụ oyi - Osinbajo

Osote onyeisiala Yemi Osinbajo

Ebe foto si, Twitter/ProfOsinbajo

Nkọwa foto,

Osote onyeisiala Yemi Osinbajo

Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo agwala ụmụ Naịjirịa ka ha nwee ndidi n'ihi ihe ụfụ nke sị na mmechi gọọmentị etiti mechiri okeala Naịjirịa na mba ndị gbara ya gburugburu.

Osinbajo kwuru nke a oge ọ gara njem nleta na Edo steeti na Fraịdee.

Ọ kọwara na ihe e ji mechie border bụ ka a kwụsị mbubata ahịa n'ụzọ ezighi ezi.

N'okwu ya: "Anyị gbachi nkịtị ka mba ndị ọzọ na-ebubata ngwaahịa n'ụzọ ezighi ezi, ọ ga-eme ka nkọpụta nri na Naịjirịa nwụọ kpam kpam."

"Anyị chọrọ ka ndị oru ugbo anyị nwee ohere ire ihe ha kọpụtara n'ahịa dị na Naịjirịa."

Aha onyonyo,

Nigeria Boarder closure: 'Mmechi bọda agaghị egbo mkpa ọbụla' - Cosmas Maduka

"Ọzọkwa, anyị achọghị ka mba ndị ọzọ jiri anyị na-egwu egwu."

"Ihe anyị na-arịọ bụ ka ndị mmadụ nwee ndidi; mmechi 'border' bụ maka ọdị mma mmadụ niile."

kaikpe Dogo enwerela onwe ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị uweojii

Abdu Dogo, onye ọkaikpe dabara n'aka ndị ntọrị abalị anọ gara aga, enwerela onwe ya.

Dogo bụ onye ọkaikpe n'ụlọikpe ukwu dị n'Akure, isi obodo Ondo steeti.

Aha onyonyo,

Kidnappers: Ndị ntọ asaala asịsa

A tọọrọ ya n'ụbọchị Tuesday, abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Ọktoba.

Mana ndị uweojii kwuru na a tọhapụrụ ya nelekere abụọ nke isi ụtụtụ ụbọchị Satọdee.

O dochabeghị anya ma a kwụrụ ndị ntọrị ahụ ụgwọ tupu ha atọhapu ya.

Buhari alọtala

Ebe foto si, Twitter/Bashir Ahmad

Nkọwa foto,

Buhari na-ekele ndị bịara ịsị ya nnọọ.

Onyeisiala Muhammadu Buharị alọghachila Naịjirịa site na mba Rọshịa ebe ọ gara sonye na ọgbakọ Rọshịa Afrịcan Summit.

N'ọgbakọ ahụ, Naịjirịa na Rọshịa nwere nkekọrịta dị icheiche etu mmekọrịta mba abụọ ahụ ga-esi kawanye mma, dịka o si gbasata azụmahịa, nchekwa na mmịpụta mmanụ agbidi.

Ọkụ na-eyi ndị California egwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọkụ ahụ agbariela ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ

Oke ọkụ ọgbụgba na-eyi ndị mmadụ egwu ugbua na mpaghara dị iche iche n'obodo California nke dị na mba Amerịka.

Ihe karịrị puku mmadụ iri ise esila n'ụlọ ha gbaa ọsọ ndụ n'ihi ọkụ ahụ ebe ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ ka na-anwa oke ha ịgbanyụ ya bụ ọkụ.

Ndidi agwọọla Southampton ịba

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Wilfred Ndidi

Nwaafọ Igbo bụ Wilfried Ndidi na ndị otu egwu bọọlụ ya bụ Leicester City gara be ndị Southampton n'abalị ụnyaahụ were ọkpụ goolu itoolu asataghị asata wee sụọ ha akwụ.

Jamie Vardy na Ayoze perez nyere goolu atọ atọ na ya bụ asọmpi.

Leicester bụzị ndị nke anọ na tebulu egwu bọọlụ mba Ịngland ugbua.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'