Nekede Students' Protest: Ndị EFCC, SARS na-emekpa anyị ahụ

Federal Polytechnic Nekede Image copyright fedpolynekede.edu.ng

Ụmụakwụkwọ nke ụlọakwụkwọ Politekiniki dị na Nekede, n'Imo steeti, na-ewe iwe maka oke mmekpa ahụ nke ha sị na ndị ọrụ nchekwa na-emekpa ha.

Iwe ha gbajuru n'ọnụ n'ụbọchị Fraịdee nke mere ka ha were okwute chụọ ndị ọrụ nchekwa ọsọ ụkwụ eru ala na ụlọakwụkwọ ahụ.

Otu nwata akwụkwọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị SARS bịara ịkpụrụ ụfọdụ ụmụakwụkwọ.

SARS bụ ngalaba ndị uweojii a kpọrọ 'Special Anti-Robbery Squad' na Bekee.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption#EndSars: Ekwesiri imechi Sars kpatakpata

Nwaakwụkwọ a kwuru na ugboro ugboro ka ndị ọrụ nchekwa dị icheiche na-abịa eyi ụmụakwụkwọ egwu.

O kwuru sị: "Abalị abụọ gara aga, ọ bụ ndị EFCC bịara kpụrụ ụmụakwụkwọ karịrị iri ise."

"Ụnyaahụ bụ ndị SARS. Ha anaghị ekwe anyị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko."

EFCC bụ ngalaba na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka nke pụtara 'Economic and Financial Crimes Commission' na bekee.

Gịnị na-ese?

Image copyright Twitter/OfficialEFCC
Nkenke aha onyonyo Ugboro ugboro ka ndị EFCC kwuru na ha anwụchiela ụmụokorobịa ji kọmputa egwu wayo

Dịka nwaakwụkwọ ahụ si kwuo, ndị ọrụ nchekwa na-ebo ụmụakwụkwọ ebubo na ha bụ ndị ohi maọbụ ndị ji igwe kọmputa aghọgbu ndị mmadụ nke bekee kpọrọ 'internet fraudsters'.

Mana ọ kọwara na mwakpo a akarịala nke na ha agaghịzi edinwu ya.

"Mgbe ụfọdụ, mmadụ ga-anọ n'ime ụlọ ya, ndị EFCC maọbụ SARS etiwaa ụzọ, kpụrụ onye ukwu na onye nta,"

"Ha hụ na i nwere kọmputa maọbụ 'I-Phone', ha ebo gi na ị bụ onye 'yahoo yahoo', kpụrụ gị."

"Ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-eji ego buru ibu agbapụta onwe ha ma a kpụrụ ha."

Nkenke aha onyonyo Ndị mmadụ na-ebokwa ndị SARS ebubo iwakpo ụmụokorobịa aka ha dị ọcha.

"Iwe anyị bụ na ndịisi ụlọakwụkwọ anyị anaghị eme ihe ọbụla iji kwụsị ụdị mmekpa ahụ a."

Nwata akwụkwọ a anyị gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha na-ele ule ugbua.

Nke pụtara na ọtụtụ ndị SARS kpụụrụ ụnyaahụ agaghịzi eso lee ule.

Ihe ndị nchekwa kwuru

Image copyright Twitter/@EFCC
Nkenke aha onyonyo Ibrahim Magu bụ onyeisi ndị EFCC

Chris Oluka bụ onyeisi ngalaba mgbasa ozi na ụlọọrụ EFCC dị n'Enugu.

Ọ bụ ụlọọrụ a na-elekọta ụlọọrụ EFCC niile dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Ọ kọwara na ọbụ ọrụ iwu nyere ha ka ha na-arụ dịka ndị na-egbochi nrụrụaka.

O kwuru na "ihe gbasara mpụ ịntanetị ka njọ n'etiti ndị ntorobịa nọ n'ụlọakwụkwọ nakwa ndị ka guchara ọhụrụ."

Image copyright Nigeria Police Force/Twitter
Nkenke aha onyonyo Mohammed Adamu bụ onyeisi ndị uweojii

Mana Oluka kwuru na ha na-ajụ ese nke ọma tupu ha agaa ịkpụrụ mmadụ.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ pụtaghị na ikpe mara onye ọbụla ha kpụụrụ.

"Anyị na-enyocha nke ọma ma tọhapụ ndị aka ha dị ọcha.

N'otu aka ahụ kwa, Orlando Ikeoku, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo State sị na ya anụbeghị maka ngagharịiwe ụmụakwụkwọ Nekede mere na Fraịde.

O kwuru na ọ ga-ezighachiri anyị ozi ma ya nweta ya bụ akụkọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'