Abu Bakr al-Baghdadi: Ndịagha Amerịka egbuola onyeisi otu oyiegwu 'ISIS'

Abu Bakr al-Baghdad Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Abu Bakr al-Baghdadi

Onyeisi otu ndị oyi egwu bụ 'Islamic State' aha ya bụ Abu Bakr al-Baghdadi alaala mmụọ.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwupụtara nke a n'ehihie Sọnde.

Trump kwuru na ndị agha mba Amerịka wakporo al-Baghdadi n'abalị Satọdee mana o weere ogbunigwe gbagbuo onwe ya na ụmụ ya atọ.

Dịka Trump si kwuo, onweghị onyeagha Amerịka ọbụla merụrụ ahụ mgbe ha wakporo al-Baghdadi.

Ọ gara n'ihu kwuo na inwude maọbụ igbu al-Baghdadi so n'otu ihe dị ya oke mkpa dịka onyeisiala Amerịka.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Donald Trump

"Naanị otu nkịta anyị merụrụ ahụ mgbe ogbunigwe ahụ gbara."

Trump dọrọ aka na ntị na ọchịchị ya ga-egbukpọ ndị niile na-eyi ndị mmadụ egwu n'ụwa.

Onye bụ al-Baghdadi?

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Abu Bakr al-Baghdadi

Ezigbo aha ya bụ Ibrahim Awwad Ibrahim al-Badri.

A mụrụ ya n'afo 1971 n'obodo Samarra nke dị na mba Ịrak.

Ihe e ji mara ya mgbe ọ bụ nwata bụ ịgụ Koran nke bụ akwụkwọnsọ ndị okpukperechi Alakụba.

O mechara nweta nzere 'Masters' nakwa 'PhD' na ngalaba gbasara okpukperechi Alakụba.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Nga ebe a tụkpuru al-Baghdadi n'afọ 2004

N'afọ 2004, ndị ọrụ nchekwa Amerịka nwụchiri al-Baghdadi ma tụọ ya nga n'obodo Falluja, mana e mechara tọhapụ ya ka ọnwa iri gachara.

Mgbe ndịagha Amerịka gburu onyeisi ndị 'IS' nke mbụ aha ya bụ Abu Umar al-Baghdadi na 2010, Abu Bakr al-Baghdadi malitere chịwa otu ahụ.

N'onwa Eprel afọ ahụ, al-Baghdadi chịkọtara otu 'IS' nke mba Ịrak na nke Sịrịa wee kpọọ ha 'Islamic State in Iraq and Syria' (ISIS).

Mana bido afọ ise gara aga, mba Amerịka na mba ndị ọzọ gbakọrọ aka malite ibuso 'ISIS' agha dị egwu.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Obodo Mosul na mba Ịrak

Nke a mere ka ọtụtụ asịrị malite ifegharị na al-Baghdadi anwụọla.

Mana n'ọnwa ọgọst 2018, ndị 'ISIS' wepụtara ihe akụkọ gosiri na al-Baghdadi ka dị ndụ.

Ọzọkwa, n'ọnwa Eprel 2019, al-Baghdadi pụtara n'ihe onyoonyoo wee kwuo na ya ka dị ndụ.

Mana n'abalị Satọdee ka al-Baghdai zutere ọnwụ ya mana nke a ọ pụtara na 'ISIS' anwụọla?

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara