Fulani herdsmen crisis: Allen Onyema emekwaala ihe nyịrị mmụọ na mmadụ

Akụkọ ndị dị mkpa

Air Peace ekpeziela udo n'etiti Miyetti Allah na Benue steeti

Allen Onyema, Saleh Alhassan, Sammuel Ortom Image copyright @benuestategovt

Gọọmenti Benue steeti ekwuola na ndị otu Miyetti Allah arịọla ndị steeti ahụ mgbaghara maka oke ogbugbu nsogbu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọru ụgbo butere na steeti ahụ.

Ode akwụkwọ Miyetti Allah n'ogo federalụ bụ Saleh Alhassan gosiri oke nwute maka oke ogbugbu nsogbu a dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo na-ebute ma kwe nkwa ime ka mkpezi udo a tọ atọ.

Ọ bụ onyeisi ụlọrụ njem ụgbọelu Airpeace aha ya bụ Allen Onyema kpeziri udo a n'etiti Miyetti Allah na Gọvanọ Samuel Ortom na Makurdi n'ụbọchị Oktoba iri abụọ na isii.

Ndị fada a ga-amalite ịlụ nwanyị?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ụkọchukwu ụka Katọlik

Ndị Bishop ụka Katọlik na mpaghara a kpọrọ Amazon ekwekọrịtala ka a na-echi ụfọdụ ụmụnwoke lugoro nwaanyị ụkọchukwu.

Ha nwere nkwekọrịta a oge ha nwechara ọgba na Vatican.

Iwu ụka Katọlik kwuru na ndị ụkọchukwu agaghị alụ nwaanyị.

Mana oteela ndị mmadụ na-ekwu ka e lebaa iwu ahụ anya.

Tụmadị n'ebe ụfọdụ ndị ụkọchukwu kọrọ ụkọ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Pope Francis

Mpaghara Amazon gụnyere akụkụ ụfọdụ na mba Brazil, Peru, Chile, Bolivia Ecuador Venezuela na ndị ọzọ.

Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis ebinyebeghị aka na nkwekọrịta a.

Akwụkwọ visa ọhụrụ

Image copyright Nigeria Immigration
Nkenke aha onyonyo Onyeisi ndị 'Immigration' Mohammed Babandede na-egbuchapụrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mbata na ọpụpụ ndị mmadụ na Naịjirịa bụ Immigration service na-atule iwepụta ụdị akwụkwọ visa atọ ọzọ.

Onyeisi ngalaba a bụ Mohammed Babandede kwuru na visa atọ ọhụrụ a ga-eme ka ọdịwanye mfe ndị mmadụ ịbata Naịjirịa.

Babandede kọwara na vịsa ndị a gụnyere nke ndị na-abịa njem nlere anya (tourist), nke ndị na-abịa ịchụ nta ego (investors), na nke ndị na-abịa ezumike nka.

Nnwereonwe Catalonia

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ndị ntọrọbịa na-eme ngaghariwe n'ihu ụlọọrụ ndi uweojii dị na Barcelona ụbọchị satọde

Ihe ruru mmadu puku narị atọ n'ụma emeela ngaghariwe na Barcelona maka mkpọchị n'ụlọ mkpọrọ onye ndu ndị Catalonia dị na Spain na-achọ nwereonwe ruo ugbua.

A haziri ya bụ ngaghariwe iji wee kwado ọchịchọ nwereonwe obodo ahụ na-arịọ kamgbe afọ 2008 mba Spain nwechara nsogbu akụ na ụba.

Cheta na ụlọikpe dị na Spain nyere iwu ka akpọchie ndị isi Catalonia na-achọ nwereonwe ruru itoolu n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Oktoba rue afọ itoolu maọbụ iri na atọ n'ụlọ mkpọrọ.

Ndị ọreụ gbata gbata na-ekwu na ọtụtụ mmadụ emerụọla ahụ kamgbe ngagharịwe a malitere nso nso a.

Ebe,

Image copyright AFP

Ebe onyeisiala mba Chile bụ Sebastian Pinera achụọla ndị imeụlọ ụlọrụ ya niile ka o wee ghọpụta ndị ọhụrụ ga-enyere aka gboo mkpa kpatara ngaghariwe ndị mba ahụ mere nso nso a.

Mgbapụta ụmụakwụkwụọ atọrọ na Kaduna

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii nọ na steeti ahụ na-ekwu na ọ bụ kepu kepu amamihe ha nwetere mere ka ha gbapụta ụmụaka ahụ

Ka abali atọ gafechara, ndị ntọ ahapụla ụmụakwụkwọ nwaanyị isi nakwa ndị ọrụ abụọ nke ụlọakwụkwọ Engravers dị na Kakau Daji, n'okpuru ọchịchị Chikun dị na Kaduna.

Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ DSP Yakubu Sabo kwuru na ha gbaputara ụmụ akwụkwọ ahụ n'ezie n'abali satọde.

Mana ụfọdụ ndị ntaakụkọ depụtara na, nne na nna ụmụaka ahụ kwụrụ ihe karịrị nde naira iri na atọ maka mgbaputa ha.

Onyeisiala etoola ụmụ Naịja

Image copyright @thenff

Otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa ndị erubeghị afọ iri na asaa pịawara ndi otu Hungary azụ n'abalị Satọdee.

Ha ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ wee merie ha na asọmpi nke mmepe iko mba ụwa afọ 2019.

N'ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari, ike ụmụaka ahụ kpara tụrụ onyeisiala n'anya.

Buhari bunyere ha ụkpa ekele ma gbaa ha ume ka ha jide ka ha ji.

Naịjirịa ga-ezute Ecuador n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Oktoba.

Nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'