Infant Mortality Rate: Gịnị na-akpata ya nakwa etu ị ga-esi gbochie ya

New breast milk bank in Nairobi, Kenya
Nkenke aha onyonyo Nwa a mụrụ ọhụrụ.

Ọnwụ umụaka na-arị ibe ya elu na Naịjirịa emeela ka gọọmenti Naịjirịa wepụta atụụmatụ ha ga-eji belata ya bụ ọdachị.

Ejike Ezeh bụ onyeisi ngalaba akpọrọ 'National Population Commission' onye gwara ndị ntaakụkọ maka mbọ ọhụrụ a kwuru na ọnwụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ nọ n'ogo otu narị n'ụma n'ime nwa ọmụmụ otu puku ọbụla.

Nke ka agba anya mmiri bụ na ngalaba dịka UNICEF, World Health Organization, World Bank na ndị ọzọ na-ahụ maka ahụike ụmụaka na ụmụnwaanyị achọpụtala na site n'afọ 2017 ruo 2030, ihe ruru ụmụaka nde iri na isii (16 million) amụrụ ọhụrụ ga-anwụ tupu ha eruo afọ ise.

Mana kedụ ihe na-akpata ya bụ ọdachị?

Dọkịta Akinde Akinshola na-ahụ maka ahụike ụmụnwaanyị kwuru na ihe isii a nwere ike ịkpata ọnwụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ:

  • Ịmụkwo nwa amụkwo
  • Nkwụsị ikuku 'ọksigin' ka amụpụtara nwa ọhụrụ
  • Ọrịa na-efe ụmụaka amụrụ ọhụrụ
  • ọgbụgbọ na ọnyụnyụ
  • Nje Tetanus
  • Jọndisi

Ọ gakwara n'ihu kọwaa ụzọ e nwereike igbochi ya bụ ọnwụ

  • Nwepụta nchekwa ahụike zuru oke
  • Nne na nna kwesiri ị na-aga ụlọọgwụ zuruoke ị natara nwa ha ọgwụgwọ
  • Ụmụnwaanyị kwụsị ịmụ nwa n'aka ndị na-ana nwa n'ụlọ
  • Ụmụnwaanyị kwesiri ị na-enye nwa ha ara site n'ụbọchị a mụrụ ha ruo ọnwa isii
  • Ụmụnwaanyị kwesiri ị na-agba ọgwụ mgbochi

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionYouth Relationship: Ụmụagbọghọ ekwuola ihe ha ga-emere ọyị ha nwoke