EPL Results: Etu okwe si gbaa na 'Premier League' taa

VAR gụpụrụ goolu Sokratis nyere. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo VAR gụpụrụ goolu Sokratis nyere.

Otu egwu bọọlụ dị icheiche a ma aha ha zutere onwe ha n'egwuregwu 'English Premier League' na mgbede Sọnde.

Mana ọbụ ndị Arsenal ka obi kacha gbawaa n'ihi ihe igwe 'Video Assisted Refree' (VAR) mere ha.

Arsenal na ndị Crystal Palace nyere onwe ha ọkpụ goolu abụọ abụọ.

Mana 'VAR' gụpụrụ goolu nke atọ Arsenal nyere.

Mana odochaghị anya ihe kpatara e ji gụpụ goolu ahụ.

Ọbụkwa 'VAR' nyere penariti ndị Crystal Palace ji nye goolu mbụ ha

Liverpool na Tottenham

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Jurgen Klopp

Liverpool ji bọọlụ gbarie ndị Tottenham, mana goolu ekweghụ ha nnyete.

Ha mechara were o jisi ike merie ya bụ asọmpị site n'inye goolu abụọ a satara otu.

Jordan Henderson na Mohammed Salah bụ ndị nyeere Liverpool goolu ebe Harry Kane nyere nke ndị Tottenham.

Manchester United na Norwich

Image copyright Getty Images

Ekwensu ndị Man Utd chọrọ ịbụ ha ọnụ taa mana ha mechara lafere.

Ọkpụ goolu atọ asatara otu ka ha ji merie ndị Norwich.

Ndị nyere goolu ahụ bụ McTominay, Marcus Rashford na Anthony Martial.

Mana goolu ha gaara eru ise.

Rashford na Martial tara penariti abụọ na asọmpi ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'