Davido: Ihe nkiri na-egosi na a kụrụ ụmụagbọghọ kparịrị ya ịga

Davido

Davido enyela iwu sị hapụ ụmụagbọghọ abụọ a nwụchiri maka ibo ya ebubo ụgha.

O kwuru nke a n'elu Twitter ka ndị mmadụ malitere itinye ọnụ n'okwu banyere nwụchi a.

Ihe nkiri na-efegharị n'ịntanetị na-egosi ka ụmụnne abụọ boro Davido ebubo ịtụwa otu n'ime ha ime yi ịga n'aka.

Nke a na-abịa dịka Davido ezigbo aha ya bụ David Adeleke, ṅụchara iyi na ọ ga-ahụ na a nwụchiri ha maka ibo ya ụdịrị ebubo a.

Ụmụnne abụọ ahụ pụtara sị na ọ bụ njakịrị ka ha na-ama, na ha amaghị na ọ ga-ewuru ebe o wururu.

Onye otimkpu Davido ama dịka 'Special Spesh' tinyere ihe nkiri nwụchi ha n'elu Instagram.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Bala Elkana akatọọla agwa Special Spesh ezigbo aha ya bụ Edward Ijah kpara, na-ekwu na mmadụ nkịtị nwereike ịnwụchi ibe ya nyefee ya n'aka ndị uweojii, mana ị nweghị ikike ịgba ya n'anwụ dịka o si mee.

N'ihi ihe nkiri ahụ, aha Davido malitere na-ewu na soshal midia.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ihe dị ụmụagbọghọ ahụ mma, ndị nke ọzọ na-ekwu na ọ dịghị mma.

@Biisi96 sị na ọ dị mma na ndị mmadụ si n'aka ihe a mere ụmụagbọghọ a mụrụ akọ.

@london_used kwuru sị na ọ ma na enweghị ihe Davido ga-eme ụmụagbọghọ ahụ, mana ọ dị mma na o ji ha kụziere ndị ọzọ ihe, ọkachasị ndị na-akparị mmadụ n'elu soshal midia.

@TORRESBLOG094 sị na ọ pụtara na Davido "amaghị ihe bụ egwu na nke abụghị"

Ụlọikpe eweliela aka Chidoka, Ifeanyi Ubah

Ụlọikpe mkpegharị dị n'Enugwu steeti ekpebiela na ọ bụ Ifeanyi Ubah meriri na ntuliaka maka oche nnọchiteanya Sineti nke Anambara Saụt, na ọ bụghị Chris na Andy Ubah nwanne ya.

Image copyright Ifeanyi Ubah/twitter
Nkenke aha onyonyo Ifeanyi Uba

Ha welikwara aka Obinna Chidoka dịka onye zọtara oche nnọchiteanya nke Idemili Nọt na Saụt n'Anambara steeti, n'ụlọomeiwu nta, ma sị ụlọọrụ Inec napụta Ifeanyi Ibezi asambodo mmeri e nyeburu ya.

Igbo ga-adị o!

Gọọmentị Imo steeti amaala iwu sị ka e riwezie asụsụ Igbo ka ji n'ụlọakwụkwọ niile nọ na steeti ahụ site na Praịmarị ruo mahadum.

N'ofesi,

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Hariri kwuputara maka arụkwaghịm ọ gbara n'elu ihe onyonyo

Praịm minista mba Lebanon bụ Saad Hariri etinyela akwụkwọ arụkwaghịm dịka ndị mba ahụ na-eme ngagharịiwe kemgbe izu abụọ maka oke ihe isi ike nakwa nrụrụaka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ngagharịiwe a ebutela mgbachi ụlọakụ, ụlọakwụkwọ ma mahadum na ụlọọrụ ndị ọzọ kemgbe ụbọchị iri.

Mba Lebanon so na ndị kacha jide ụgwọ n'ụwa.

N'egwuregwu,

Ndị otu Golden Eaglets nke Naịjiria ga-ezute Ecuador n'elekere itoolu nke abalị a ebe a na-ama aka iko mbaụwa nke ndị na-akarịghị afọ iri na asaa.

N'otu aka ahụ, Manchester City ga-ezute Southampton ebe Everton bụ ebe Alex Iwobi na-agba bọọlụ, ga-ezute Watford ịma aka maka iko Carabao.

Ala ezeela ma rie ndị mmadụ n'ime ụlọ ha

Image copyright DIMITRI KAUTE

Ala zere n'ime abalị ma rie ọtụtụ ndị mmadụ na-ehi ụra n'ime ụlọ ha na Ngouache dị na Bafoussam nke Kameruun.

A ka na-achọ ndị mmadụ n'ime ala a zere ma gbuo mmadụ iri abụọ ebe otu onye na-anata ọgwụgwụ n'ụlọọgwụ.

Oke ụjọọ ka dị n'ihi na ọtụtụ ndị mmadụ ka tọrọ n'ime ala dịka gọvanọ mpaghara ọdịda anyanwụ na Kameruun bụ Awa Fonka Augustin si kwuo na Redio.

Gọvanọ a kwuru na mpaghara ahụ adịghị mma kama na a na-agba mbọ ịchọpụta ndị ka tọrọ n'ime ala.

Idemmiri atọhapụla ndị mkpọrọ na Kogi steeti

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye a tụrụ ịga

Oke mmiri zoro n'ụtụtụ ụnyaahụ mere ka idemmiri kwatuo ụlọ mkpọrọ Koton-Karfe dị na Kogi steeti ma nye ndị mkpọrọ ohere iri mbọmbọ ọsọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ nchekwa n'ụlọ mkpọrọ a bụ Nihi Sesan gwara BBC na idemmiri kwaturu ụlọ ma ebe ndị mkpọrọ nọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionUle ụlọ mkpọrọ

Ọ sị na ọ mabeghị mmadụ ole ndị mkpọrọ gbara ọsọ mana akụkọ na-ekwu na ha ruru mmadụ narị abụọ.

Sesan gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ nchekwa dịka DSS, ndịagha na ndị uweojii na-agba mbọ ịhụ na a nwụchigharịrị ndị a gbara ọsọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Williams Ovye Aya sị ndị nchekwa obodo tinyekwara aka mere ha ji nwụchie mmadụ iri atọ na otu.

Gọọmentị etiti agaghị agwa anyị ego ole anyị ga-akwụ - Ndị gọvanọ

Image copyright Presidency/Twitter
Nkenke aha onyonyo Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa

Otu jikọtara ndị gọvanọ na Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị gọọmentị etiti ga-ekpebi ego ole ndị gọvanọ ga-akwụ ndị ọrụ dịka ụgwọ ọnwa opekatampe.

Onyeisi ha bụ Kayode Fayemi bụ gọvanọ Ekiti Steeti sị Steeti agaghị akwụfe etu ike kwere ha.

N'ofesi

Image copyright Reuters

Ihe ruru mmadụ otu nde na ụma agaghị enwe ọkụ latrik na Steeti Kalifonịa n'ihi ọkụ na-agba n'ọzara a kpọrọ Wildfire na Bekee.

Ọkụ ọgbụgba ji oke ikuku na-efesasị na mpaghara dị iche iche etinyela isi na Los Angeles n'ụbọchị Monde.

Image copyright Getty Images

Gareth na-agbara Real Madrid bọọlụ agbagidela ụkwụ n'ikike dịrị onye ma gwa Madrid ka ha hara ibipụta akwụkwọ banyere ọnọdụ ahụike ya.

Akụkọ kwuru na Bale gara zute onye na-anọchite anya iji mara ọdịnihu ya na Real Madrid.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla