Ipob and Police clash: Ọ bụghị eziokwu, ọ bụ ndị uweojii wakporo anyị - Ndị

Ipob and Police Image copyright Getty Images

'Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi Steeti sị na ndị Ipob bara ha ọgụ mgbe ha gara igbochi nzukọ ha na-eme.

Ọ gwara BBC Igbo na ha nụrụ kepukepu maka nzukọ ndị Ipob na-eme n'otu obodo n'Ebonyi na ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ wụchiri ebe ahụ ịga chụsasịa ha.

Ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị uweojii na otu Ipob n'Ebonyi ebe ndị otu a na-agba mbọ maka nnwereonwe ha, nwere ọgbakọ.

Dịka ha rutere ebe ahụ, na ndị Ipob malitere mawa ha okwute ma merụọ ụfọdụ ndị uweojii gụnyere otu onyeisi ndị uweojii n'ọgbọ ahụ bụ John John nọ n'ụlọọgwụ ugbua.

Ọ sị na nke a mere ha ji were anwụrụ anyammiri gbawa ndị Ipob ma nwụchie mmadụ isii n'ime ha.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti

Odah sị na otu n'ime ndị a nwụchiri ji egbe, ebe onye ọzọ bụ ọkaiwu ha n'Ebonyi bụ Ndubuisi Steven na mmadụ anọ ndị ọzọ.

Ọ sị na ha kpụpụrụ mmadụ isii a n'ụlọikpe ma ọkaikpe sị ka akpọchie ha n'ụlọmkpọrọ ruo ọnwa Disemba a ga-ekpe ikpe ha ọzọ.

Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ma o nwere ndị Ipob ndị uweojii merụrụ ahụ, Odah sị mba na ihe ndị uweojii mere bụ iji anwụrụ anyammiri chụsaa ha.

Ọ sị na Ipob bụ otu gọọmentị Naịjirịa machiri amachi na ha enweghi ikike ọbụla inwe nzukọ.

Mana Ipob na-arụ ndị uweojii aka na ha wakporo ha ebe ha nọ eme nzukọ, gbaa ọtụtụ ndị otu ha egbe ma merụọ ụfọdụ n'ụzọ dị iche iche

"Anaghị amachi mmekọrịta mmadụ na ibe ya."

Na mkparịtaụka BBC Igbo na otu ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Paul Achalla nwere, ọ gwara BBC Igbo na ndị uweojii wakporo ndị otu ha gbawa ha egbe.

Image copyright Paul Achalla
Nkenke aha onyonyo Paul Achalla

"Ọtụtụ merụrụ ahụ, ebe e gburu ụfọdụ ma nwụchikwa ụfọdụ.

"Anyị amabeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole e ji eji maọbụ ndị e gburu."

Achalla katọrọ mmekpa ahụ nke ndị uweojii na-emekpa ndị ndị otu Ipob dịka o kwuru na onye ọbụla nwere ikike n'iwu ịgbakọrọ onwe ha.

"Anaghị amachi mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Kedụ ihe gosiri na ndị gbakọrọ bụ ndị Ipob?"

Achalla onye boro ebubo na gọọmentị ji aka nro na-eso ndị Boko Haram na ndị ọchịehi ji ngwaọgụ na-ememila ndị mmadụ, gara n'ihu jụọ,"Ọ na-abụ a hụ ebe ọbụla ụmụ Igbo gbakọbara agbakanyere ha egbe?"

Akụkọ ga-amasị gị: