Dice Ailes: Onye bụ 'Sarah Baartman' a e ji maka ya adọri ya?
- Chimamaka Ihenacho
- Broadcast Journalist, Igbo

Ebe foto si, Science Photo Library
Eserese na-egosi Sarah Baartman site n'akụkụ ya na n'ihu ya
Sarah 'Saartjie ' Baartman bụ otu nwaanyị ụfọdụ akụkọ ụwa agaghị echefu maka ihe ọ gabigara n'aka ndị ọcha oge ọ bụ ohu.
Baartman bụ nwaanyị mba Saụt Afrịka otu dọkịta mba Briten kpọfere ala Bekee, hụrụ nwịị n'obodo oyibo makana e ji ya were na-eme akaja ma bụrụ onye ọha na-abịa agba nkiri.
Dịka akụkọ mgbe ochie si kwuo, dọkịta ahụ tinyere ya ebe a na-akpọ "museum" ka ndị ọcha ibe ya na-ele ya anya ịkwa emu maka etu ahụ ya dị (o nwere nnukwu otele nke ọtụtụ ndị ọcha ahụtubeghi mgbe ahụ).
Akụkọ a kwukwara na o nwere ọrịa otele ukwu a kpọrọ "steatopygia".
N'agbanyeghi ihe Baartman gabigara mgbe ọ dị ndụ, na ọ nwụrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Disemba n'afọ 1815 ka ọ dị naanị afọ 26, akwụsịghị mkparị akparịrị ahụ ya.
Otu onye ọcha a kpọrọ Georges Cuvier chịkọrọ ma ụbụrụisi ya, ọkpụkpụ ahụ ya nakwa ihe ndị o ji bụrụ nwaanyị (sexual organs), wee ka na-edowe ya ebe igwe mmadụ ga na-abịa agba ya nkiri n'obodo Paris dị na mba Frans.
Ha gbagidere ya n'anwụ ruo afọ 1974, mana ọ bụ n'afọ 2002 ka ndị mba Saụt Afrịka bịara kporo ihe fọrọ n'ozu ya ma lie ya n'ala ha.
Ihe e ji adọri Dice Ailes
Ebe foto si, Twitter/@DiceAiles
Dice Ailes bụ otiegwu ezigbo aha ya bụ Shasha Damilola Alesh tiputara egwu ọhụrụ ọ kpọrọ "Gịnịka".
Na foto o ji egosipụta egwu a ọ sị bụ maka ịgwa ụmụnwaanyị na ha nwere ike iji ahụ ha mere ihe ọbụla masịrị ha, o ji eserese Sarah Baartman tinye n'elu ya.
Nke a mere ka ndị mmadụ dọkawa ya ka mpempe akwụkwọ, na-ekwu na ọ dị ka ọ maghị ihe Baartman gabigara ọ ga-eji were na-akparị ya na-aga n'ihu.
Ailes na onwe ya ka ọ na-agbara isi onwe ya depụtara ebumnuche ya n'elu Twitter.
Lee Ihe ndị mmadụ nwere ikwu na Twitter
@Abisolathegreat kwuru sị na Ailes kparịrị Baartman site n'ihe o mere, ma jụọ ma ọ makwa onye nwaanyị o ji eserese ya mee ihe a bụ?
@cremechic11 kwuru na ọ bụghị etu a ka e kwesịrị isi too nwaanyị ahụ.
@ekesunvictor kwuru na ọ bụ maka ụdịrị ihe a ka o ji ewe iwe maka otu nwoke na-eke ụmụnwaanyị agbụ.
@_bhadmus kwuru na nke a gosiri na akụzighi akụkọ mgbe gboo n'ụlọakwụkwọ etu e kwesịrị isi mee ya.
@_mimiAbu kelere Ailes sị na ọ bụ maka ya ka o ji mara onye Baartman bụ ugbua.
@OlumideOG kwuru sị na ọ ghọtaghị ihe mere e ji akpọ Ailes aha ọjọọ maka ito ahụ Baartman.
Ihe nkiri ga-amasị gị:
Killiwee Nwachukwu

Vidio, Uche Ntoroọbịa: Ị ga-eme enyi tupu ị malite alụmdinanwunye?
Ndị ntoroọbịa tinyere ọnụ n'okwu banyere ime enyi na njem alụmdinanwunye.