Buhari vs Atiku: Ihe ndi Igbo nwere agba na-ekwu maka mkpebi Ụlọikpe Kachasị

Getty/Obioha/Uwazuruike Image copyright Getty/Obioha/Uwazuruike

Otu ndị na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob n'ịchafụ ekwuola na mkpebi Ụlọikpe Kachasị na okwu gbasara onye meriri na ntuliaka onyeisiala 2019 agbaghị ha gharịị n'ịhị na ọ bụ eze ama na a ga-echi.

N'ụbọchị Wenezde, Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa bụ 'Supreme Court' weliri onyeisiala Muhammadu buhari aka elu dịka onye meriri ntuliaka maka ọkwa onyeisiala e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a.

Mana ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Peace Chukwudi gwara BBC Igbo na ihe mere bụ mmezu afa nke otu Ipob gbara na o nweghi uru dị n'isonye na ntuliaka 2019.

"Ọ bụ mmezu ihe Ipob kwuru na ọ baghị uru isonye na ntuliaka nke ekpebirila onye ga-emeri tupu a tụọ vootu."

O kwukwara na mkpebi ahụ bụ amamikpe nye ndị si na ha ga echekwa vootu a tụụrụ ha ka mmiri ghara ịba ya ntị.

" Nke a bụ ngosi ihe bụ iberibe bụ ịma eziokwu, ihu eziokwu mana kwenye na asị."

Buhari emeriela Atiku na 'Supreme Court'

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Muhammadu Buhari

Abubakar Atiku na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ 'Peoples Democratic Party' (PDP) gbara Buharị na ndị pati ya bụ 'All progressives Congress' (APC) akwụkwọ.

Ha kwuru na Buharị na ndị APC mere nnukwu nrụrụaka na ntuliaka ahụ.

Image copyright @Atiku/@MBuhari

Onyeisi ndị ọkaikpe na Naịjirịa bụ Tanko Muhammed na ndị ọkaikpe isii ọzọ so kpee ya bụ ikpe.

Ha gụnyere: Bode Rhodes-Vivour, Kayode Ariwoola, Amiru Sanusi, John Inyang Okoro, Ejembi Eko and Uwani Abba-Ajji.

Ha niile kwekọrịtara na ebubo nrụrụaka Atiku boro Buharị enweghi isi na ọdụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNkwa Buhari na Atiku: Ihe Ndigbo chere

Ụlọikpe mkpesa bụ 'Court of Appeal' ekwubuola na ọbụ Buhari meriri na ntuliaka ahụ dịka ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission' (INEC) si kwupụta.

Mana Atiku na ndị PDP ekwetaghị nke mere ka ha buru ikpe ahụ pụ 'Supreme Court' nke bụ ụlọikpe kachasị na Naịjirịa.

Ihe ndị ọzọ na-ekwu maka mkpebi ụlọikpe

Ọ bụghị naanị otu Ipob otu,a ndị ọzọ nwere agba n'Igbo etinyela ọnụ na ya bụ mkpebi Ụlọikpe Kachasị.

Lee ihe ha kwuru:

Nke a ga-enye ohere maka onye Igbo ịbụ onyeisiala na 2023- Otu South-East for President 2023

Image copyright Okechukwu Obiora/Facebook

N'uche ya, onye nchịkọta otu South East for President 2023 bụ Rev Okechukwu Obioha kwuru na "Ihe ọ pụtara na Buhari ga-ano ruo afọ ato na-abia tupu ndị Ọwụwanyanwụ bụ ndị ọ ruru

"Mkpebi a bụ etu Chineke si kwuo. Buhari ga-achizi afọ asatọ, ọ(ọchịchị) gbadatazie na ndida Naijiria. PDP na APC kwesiri inye ọwụwaanyanwụ ọkwa onye ha zọrọ ha onyeisiala."

Otu ahụ gara n'ihu rio Atikyu ka ọ nọgide na otu PDP ma kwado ha iwere onye Igbo dịka onye ga-azọrọ pati haọkwa onyeisiala n'afọ 2023.

Ụlọikpe Kachasị dara ya- Okaiwu Goddy Uwazuruike

Image copyright Goddy Uwazuruike
Nkenke aha onyonyo Goddy Uwazurike bu onye ọkaiwu ma burukwa onye bụ bụ aka Ikenga

Obi adịghị Goddy Uwazuruike bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye bụbụ onyeisi Aka Ikenga mma maka mkpebi Ụlọikpe Kachasị n'okwu Atiku na Buhari.

Uwazuruike siri na, "A gbasoghị ikpemkwụmọtọ na ya bụ ikpe."

"Ụlọikpe Kachasị dara ya site na ịhapụ ilebanye anya n'ihe niile gbara ọkpụụ bụ isi okwu n'ikpe."

"Anya onye ọbụla dị na ya bụ ikpe tupu egwu adagharia n'ikpe mgbegharị. Mkpebi a bụ ịwụ ụkwụ n'ala."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionYouth Relationship: Ụmụagbọghọ ekwuola ihe ha ga-emere ọyị ha nwoke