Umuahia Landslide: Hapụnụ okirikiri ebe mbuze na-eme

Mbuze

Gọọmentị Abia Steeti adọọla ndị mmadụ aka na ntị ka ha hapụ okirikiri ebe ahụ mbuze loro ụlọ ndị mmadụ n'Amuzukwu-Ibeku, Umuahia.

Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu bụ Solomon Ogunji kwuru nke a oge ọ gara ebe ya bụ ihe mere n'ụbọchị Wenezde.

Ogunji kwuru na "Mbuze a abụghị nke oke ideimmiri kpatara."

"Anyị nụrụ na ala mara jijiji, anwụrụ eju ebe niile tupu mbuze ahụ emee."

"Ndụmọdụ anyị bụ ka ndị mmadụ si n'okirikiri ahụ pụgodu, ganye mgbe anyị ga-emecha nchọpụta ihe kpatara mbuze a."

N'akwụkwọ ozi ha zipuru ụbọchị Tọọzde, gọọmentị Abia kwuru na ihe ahụ mere abụghị mbuze nkịtị.

Onye zipuru akwụkwọ ozi ahụ bụ Onyebuchi Ememanka, onyeisi mgbasa ozi nke Gọvanọ Okezie Ikpeazụ.

Cheta na nnukwu mbuze kwaturu ụlọ ndị mmadụ n'Ibeku n'ime abalị Monde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Ọktoba.

Dịka akụkọ ahụ si kwuo, obere ihe ka otu nwaanyị na nwa ọhụrụ ya ji gbanahụ ya bụ ọdachi.

Nwaanyị ahụ kuru nwa ya gbapụta n'ezi oge ọ hụrụ na ụlọ ha na-ama jijiji.

O teghị aka, o ku nwa ya gbapụta, ụlọ ha dakpuru n'ime ala.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionFisayo Soyombo: Ihe mere o ji zoo ezoo mee nnyocha n'ụlọmkpọrọ