Anambra Fire: Gọọmentị amachiela gwongworo bu mmanụ ụgbọala ịgba n'ehihe

Image copyright PoliceNG

Gọọmentị Anambra sị na ọ chọghịzi ka gwongworo bu mmanụ ụgbọala ịgba n'ehihe na steeti ahụ.

Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba bụ onye binyere aka n'akwụkwọ mgbasaozi kwọwara etu atumatụ a ga-esi gaa.

Adinuba sị na atụmatụ a ga-emetụta gwongworo ọbụla bu mmanụ ụgbọala pụtara maka mberede ọkụ dakwasịrị steeti ahụ n'ime ọnwa Ọktoba nakwa gwongworo dara n'ụtụtụ ụnyaahụ.

Akwụkwọ a sị site n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba bụ Satọde, agaghị ekwe ka gwongworo bu mmanụ ụgbọala banye ụzọ site elekere ise nke ụtụtụ ruo elekere asatọ nke abalị.

Ọzọ bụ na ụgbọala ndị a agaghị agbafee ọsọ ihe Bekee kpọrọ "90km per hour".

Gọọmentị Anambra sị ka ndị ọrụ nchekwa hazie onwe ha maka ọrụ dịrị ha banyere atụmatụ a.

Akwụkwọ a gakwara n'ihu kwuo na gọọmentị Anamabra ga-ata onye ọbụla dara iwu a ahụhụ ruru ihe ha mere.

Ọ rịọrọ ndị na-ebugharị mmanụ ụgbọala ka ha diwe nsogbu ọbụla atumatụ a ga-ebute ma nyere gọọmentị aka hụ na atumatu a e mere maka nchekwa obodo di ire.

Cheta na ọkụ ọgbụgba sitere na gwongworo dara n'ụzọ si Onịcha gawa Enuwgu banyere ọwammiri wee tapịa ngwaahịa na mmadụ n'ahịa Ọchanja n'ụbọchị nke iri na isi nke ọnwa Ọktoba, 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara