Identity Theft: Etu atụmatụ a nwereike ịnapụ gị ihe niile

Onye na ezu njirimara ndí mmadụ Image copyright Getty Images

Ajụjụ ụfọdụ mmadụ na-ajụ ajụkwanye bụ "Gini bụ "Identity Theft"?

Agbanyeghị na atụmatụ a nwereike na-agbagwoju ụfọdụ mmadụ na mpaghara Naịjirịa anya, ndị bi n'ofesi, ọkachasị Amerịka, Canada nadị ọzọ nwere atụmatụ akpọrọ "Social Security number" ma maka ya ọfụma.

Akụkọ na-ewu ugbua bụ maka nwata nwaanyị a na-ebo ebubo na anapụrụ ndị mmadụ njirimara ha na mba Canada.

Dịka ụlọ ntaakụkọ CBC siri dee, ndị uweojii na mba Canada na-ebo Nwaada ahụ ebubo na ozuru aha na ejirimara ọtụtụ mmadụ ma were aha ha na-azụta ihe masịrị ya.

Nke dị ya mfee makana ndị mba ofesi ụfọdụ nwere ihe Bekee kpọrọ "Credit Card", nke pụtara na inwereike go ihe n'aka ma kwụọ ụgwọ obele obele.

Gịnị bụkwanụ "Identity Theft"?

"Identity theft" bụ ụzọ ndị omekaome si ezuru njịrimara ndị mmadụ na nzuzo iji zaa aha.

Ndị ohi a zute njirimara mmadụ na ihe ndị ọzọ sonyere ya, ha na-ejikara ya zụọ ihe ma mee ihe ọbụla n'aha onye ahụ ha zuru aha ya.

"identity Theft" na-etinye ndị mmadụ na'akwa arịri.

Ndị ohi njirimara mmadụ nwere ike iji njirimara mmadụ zụta ihe n'intaneti, nata ego n'ọbaego mmadụ maobụ ji na-ebi ndụ na mba dịka onye ahụ nwee aha ahụ n'ezie.

Ha nwekwara ike iji njirimara mmadụ nata ego maọbụ kpaa arụ dị iche iche nke ga-eme ka onye ahụ gaa nga ebe aka ya dị ọcha.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCyber Crime Law kpụgara m ụlọ mkpọrọ

Kedu njirimara mmadụ enwere ike izu?

E nwere njirimara ndị mmadụ ndị ohi na-akachọkarị nke a mere na ọ dị mkpa na ị matara ha ma chekwa onwe gị.

Na Najirịa, lee njirimara ndị kachasị mkpa ikwesiri ichekwa maka ọdịmma gi.

Akara mkpọhe Kọmpụta (Password):

Nke a bụ akara ndị mmadụ na-eji abanye n'ime otutu ihe ha jị biri n'Intanetị nke gunyere ọba ego, Soshal Midịa, mgbasa ozi 'Email', dgz.

BVN:

Nke a bụ akara jikọtara ihe niile gbasara ọba ego niile mmadụ na Naijirịa.

Aha gị na akara ọba ego niile n'ụlọ akụ sonyere na BVN gị.

Akara mkphe ATM:

Onye nwere aka mpọghe ATM ga-enye mmadu ohere iwere ego dị na ụlọ akụ gị ma onye ahụ nwete akwụkwọ ATM ahụ.

Kedu etu ị ga esi gbochie mmadụ izu njirimara gị?

Dịka akụkọ a BBC dere siri kọwaa, enwere etu ndị mmadụ ga-esi gbochie mmadụ izu njirimara gị:

Nke mbụ bụ na-enweghị uru ọ bara gị igwa ndị mmadụ ihe niile gbasara gị na Soshal Midịa. Ndị enyi gị na ndị ezinụlo gi bụ ndị kwesiri ị ma maka gị ruo ụlọ.

Nwee akara mkpọhe kọmpụta siri ike nke ga-egbochi ndị ohi njrirmara mmadụ ịchọpụta ya. Enyela ya ndị mmadụ ma edetu kwana ya n'akwụkwo.

Cheta na ọ dịghị mma i ji otu akara mkpọhe emepe ọbaego gị niile.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌ gịnị bụ 'social media' n'Igbo?

Tinye ihe mgbochi 'Anti-Virus' na 'Anti-Spyware' bụ tekụnụzụ eji egbochi ndị omekome iwakpo kọmputa gị ma zuru njirimara gị.

Saa anya na mmiri n'akwụkwọ mgbakọ na mwepụ ndị ụlọakụ gị na ezitere gị kwa ọnwa ka ị mara mgbe mmadụ na-esepụ ego n'ọbaego gị.

Mgbe ọ bụla ị gara ATM were ego, gbalịa dọkacha akwụkwọ ATM na-egosi ka ọ sị gaa.

Okammụta n'ihe gbasara Ịntanetị bụ Mazi Okey Udeogu kọwakwara na ọ bụ ihe gbasara ọbaego ka akacha ezu na Naijirịa

Udeogụ nyere ndụmọdụ ka ndị mmadụ hapụ inye onye ọbụla akara mkpọhe ọbaego nke bụ 'PIN' n'okwu bekee.

O kwukwara na ụfọdụ ndi ohi na-abịa zite ozi dịka nke ụloakụ gị na ekwu na ha choro ụfodu njirimara gị.

Ọ sị na onye nwetere udi ozi a were ụkwu ya gaa n'ụlọakụ jụo ha ese.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKpọọ 'Account officer' gị ma 'bank alert' gị edoghị gị anya- Chidi Udeogu

Nke ọzọ mazị Udeogụ kwuru bụ na ndị ohi njirimara na ezitere ndị mmadụ ozi ahụghọ ga-eme ha ka ha nye ha akara ha ji akpọbe soshal Midịa ha.

Ozi a na abiakarị na email ọkachasị nke 'Yahoo Mail'

Mgbe ndị a nwetere nke a, ha nwere ike rịọwa ndị enyi gị ego n'aha gị.

Nke a na-ebute ihe ihere na esemokwu n'etiti gị na ndi mmadụ.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionYouth Relationship: Ụmụagbọghọ ekwuola ihe ha ga-emere ọyị ha nwoke